Watford vs Liverpool: Watford azọpịasiala Liverpool ka awarawa tomanto

Mohammed Salah nke Liverpool

Ebe foto si, Getty Images

Ndị otu Watford emenyela ndị Liverpool egwu taa n'be ha na Vicarage Road.

Na agbanyeghị na Liverpool ka bụ ndị mbụ n'asọmpị Premier League, kama mmerị a Watford ji ọkpu goolu atọ asataghị ma ncha merie ha tụrụ mmadụ nile n'anya.

Onye ndụ ha bụ Virgil Van Dijk kwuru na ndị Watford gbara ọfụma nke bụ na mmerị ha kwesịri ekwesị.

Van Dijk sị kwa na ọcheghị na ha mepụtara ohere inye goolu ma sị kwa na goolu atọ a tụrụ ha n'anya.