Chelsea vs Liverpool: A gbariela akwammiri 'Stamford' ndị Chelsea

Ebe foto si, Getty Images
'Ogologo abụghị na nwa m etoola' bụ ihe Liverpool gwara Chelsea na 'Stamford Bridge' n'asọmpi Premier League.
Ha mere nke a site n'iji ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie ha n'ime ụlọ ha nakwa n'ihu ndị nkwado ha.
N'ime ọkara nke mbụ na nkeji 14 ka Trent Alexander-Arnold nke Liverpool ji 'Free kick' nye goolu mbụ.
N'otu aka ahụ Roberto Firmino ji isi ya makpuo goolu nke abụọ n'ime neetị ndị Chelsea na nkeji 30.
Chelsea nwara ike ma nye ndị Liverpool otu goolu n'ime nkeji 71 site n'aka N'Golo Kante.
Chelsea gara n'ihu sie ọnwụ na ngwụcha asọmpi a ka ha nyere goolu mana Liverpool kere ezigbo nkwụcha.
Merie Liverpool nwetere bụ nke isii ha n'asọmpi isii ha gbarala na Premier League nke afọ a.
Liverpool bụ ndị mbụ ebe Chelsea bụ ndị iri na otu n'ogogo tebụlụa Premier League.










