Arsenal vs Aston Villa: Arsenal azaala 'nna m agụ' taa

Ebe foto si, Getty Images
Aston Villa bịara n'ụlọ ndị Arsenal kpaa ha aka n'ọdụ mana Arsenal gosiri ha ihe o ji bụrụ nna m agụ.
Arsenal si n'azụ were ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie ndị Aston Villa n'asọmpi nke taa.
N'isi ụtụ ihe dịka nkeji 20 ka ndị Aston Villa gbara aka ahịa ma nye Arsenal goolu nke si n'aka J. McGinn.
Dịka ọgụ a na-aga n'ihu onye bụ A. Maitland-Niles kotere ụka mere ogbu bọọlụ ji chụpụ ya na nkeji 41.
Arsenal nwetere ohere penariti nke N.Pepe nyere ha goolu na nkeji 59.
Mana Aston Villa zaghachịrị mgbe Wesley nyere goolu nke abụọ ha na nkeji 60.
Nke a gbawara Arsenal obi mere ha ji were iwe nye goolu abụọ na nkeji 81 na 84 site n'aka Calum Chambers na Pierre-Emerick Aubameyang.
Mmerie a mere ka Arsenal bụrụ ndị anọ n'ogogo tebụlụ Premier League.
Man City azọọla Watford aja

Ebe foto si, AFP
O dị otu Watford ka nrọ taa dịka otu Manchester City ziri ha egwu mmọnwụ.
City kụnyere ha isi agba okpu mgbe ha nyere goolu asatọ asataghị otu n'asọmpị ha taa.
Ihe ịtụ anya ndị mmadụ na-ekwu maka ya bụ na goolu ise n'ime ha bụ n'ime nkeji 18 ka enyere ha niile.
Etu e si nye goolu ndị a bụ Bernado Silva na nkeji 1, Sergio Arguero na nkeji 7, Riyad Mahrez na nkeji 12, Bernado Silva na nkeji 15 nakwa Nicolas Otamendi na nkeji 18.
Goolu ise ahụ bu etu e si mechi agba nke mbụ.
N'agba nke abụọ, otu Watford kuliri n'ụra gbalịa ịnye goolu mana ọ mịtaghị mkpụrụ.
Kama ihe mere bụ na Bernado Silva gbawara ụzọ goolu ọzọ na nkeji 48 nakwa na nkeji 60.
Kevin De Bruyne dọkaziri neeti ndị Watford kpam kpam na nkeji 85 mgbe o nyere goolu nke ya.
Onye ma ka obi ga-adị onye nche bọọlụ otu Watford ugbua?
Kedụ ebe Imo kwụ akwụ?

Ebe foto si, Facebook/Ihedioha
Taa ka ụlọikpe ga-ekwu hoo haa onye meriri ntụliaka ọkwa Gọvanọ emere n'Imo n'ọnwa maachị.
Dịka ọ dị ugbua ha na-emezi nchịkọta ikpe ahụ nke Uche Nwosu, Ifeanyi Ararume na Hope Uzodinma gbara Emeka Ihedioha na-ekwu na mmeri ya ezighi ezi.
Ọzọ,

Allen Onyema onye nwe ụlọọrụ AirPeace ekwuola na ha ga-aga ọzọ na mba Sawụt Afrịka bulata ụmu Naịjirịa ndị ọzọ ka chọrọ ịnata.
O rụtụkwara ndị uweojii nke mba Saụt Afrịka aka kwuo na ha na-ada agbachi nkịtị ma a na-emebisi ihe ụmụ Naịjirịa n'ihi Xenophobia.
Na mba ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị mba Kongo akwadola iwepụta ọgwụ mgbochi ọrịa Ebola nke abụọ iji belata ofufe ọrịa ahụ.
Orịa Ebola egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri n'otu site n'afọ 2014 rue afọ 2016.
Gee Nkeji ebe a
#FreeSowore: Ụmụ Naịjirịa agbrụọla ihu maka ebubo eboro Sowore

Ebe foto si, Instagram/@yelesho
Gọọmentị etiti agbaala Omoyele Sowore akwụkwọ n'ụlọikpe na-ebo ya ebubo ibupu ego na nzuzo nakwa ịchọ ịkwatụ ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari.
Ha kwukwara na Sowore kparịrị Buhari na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ mere mgbe gara aga.
Sowore bụ onye nwe ụlọọrụ ntaakụkọ 'Sahara Reporters'. O sokwa zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka e mere n'ọnwa Febrụwarị afọ a n'otu
Lee ihe ụfọdụ ndị mmadụ kwuru:
@Omojuwa kwuru na nwuchi Sowore bụ ihe ihere nye gọọmentị etiti.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Oti egwu a ma ama bụ Adekunle Gold gosikwara iwe ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@OgbeniDipo bụ onye ọka nkụzi kwuru na onweghi ihe ọjọọ ọbụla Sowore mere ma gwa gọọmentị etiti ka ha tọhapụ ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
@markessien kwuru na ọbụ sọ okwu ka Sowore kwuru.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Ndị ọrụ uweojii nzuzo Naịjirịa a kpọrọ 'Department of State Services' (DSS) nwụchiri Sowore n'abalị abụọ nke ọnwa Ọgọst.
Ihe e ji nwụchie ya bụ maka ịhazi ngagharịiwe nke ọ kpọrọ 'Revolution Now'.
Sowore kwuru na ngagharịiwe ahụ bụ maka ọchịchị ọjọọ nke si n'aka gọọmentị etiti.

Ebe foto si, Instagram/@yelesho
Cheta na ụlọikpe enyebuola ikike ka ndị DSS jide Sowore ruo abali iri anọ na ise.
Mana ka ọgachara abalị iri ise Sowore nọrọ na mkpọrọ, gọọmentị etiti agbaala ya akwụkwọ.
Gọọmentị boro ya ebubo na o ji ụzọ aghụghọ zipu ego dị dọla 74,400.
Ha kwuru na o zipuru $19,975 n'ọnwa Eprel, zipu $20,475, n'ọnwa May, zipu $16,975 n'ọnwa Jun, ma zipukwa $16,975 ọzọ n'ọnwa Julaị 2019.
Ọzọkwa, gọọmentị kwuru na Sowore chọrọ iji ngagharịiwe 'Revolution Now' wee chutuo onyeisiala Muhammadu Buhari n'ọchịchị
Mmechi 'border' na-amịta mkpụrụ

Ebe foto si, Instagram/bayoomoboriowo
Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na mmechi emechiri oke ala Naịjiria na mba ndị ọzọ gbara ya okirikiri na-amịta mkpụrụ.
O kwuru nke a mgbe ụfọdụ ndị ma ihe ekwe n'akụ maka azụmahịa bịara leta ya n'Abuja ụnyahụ.
Ndị ahụ gụnyere otu 'Nigerian Association for Chamber of Commerce, Industry, Mines and Agriculture (NACCIMA) na ndị otu 'Federation of West African Chambers of Commerce and Industry (FEWACCI)'.
Buharị kọwara na oteela aka Naịjiria jị arịọ arịrịọ ka mba ndị gbara ya okirikiri gbochilata mbubata ahịa adigboroja nakwa ntụbata ngwaahịa n'ụzọ ezighi ezi.
Mana mmechi 'border' bụ iji wee gbaa ụzọ owere mgba ka o wee chie.
Iwe Gbajabiamila

Ebe foto si, Twitter/@NGRSpeaker
Onyeisi ụlọ omeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila agbarụọla ihu etu ndi isi ọrụ nchekwa ụfọdụ siri gbajọọ ọgbakọ ọ kpọrọ iji chọọ ụzọ a ga-esi wulite nchekwa na Naịjiria.
Gbajabiamila kwuru na ọ gbara ya gharịị etu ndị isi agha, nke ndị agha ụgbọelu na nke ndị ụgbọmmiri si hapụ ịbịa ọgbakọ ahụ kama zite ndị nnọchịanya.
N'okwu ya: "Nke a gosiri na onweghị ihe ha ji ụlọomeiwu a kpọrọ."
"A ga m akọrọ onyeisiala Muhammadu Buhari ihe a ka ọ mara etu a ga-esi lebaa ya anya."
Gbajabiamila rịọrọ onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu nakwa onyeisi ngalaba na-ahụ maka mbata ndị mmadụ na Naịjirịa bụ Muhammad Babandende mgbaghara.
Ọ chụghachiri ndị bịara ịnọchite anya ndịisi ndị agha, ma yigharịa ọgbakọ ahụ ka ọ dịzie ụbọchị Monde, abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Sepụtemba.
Amerịka ga-aga Saụdi

Ebe foto si, Getty Images
Mba Amerịka ekpebiela na ha ga-eziga ndị agha ha na mba Saụdi Arebia dịka a tụrụ ogbunigwe abụọ na ụlọọrụ na-amịpụta mmanụ agbidi na mba ahụ.
Dịka onyeisi ọrụ nchekwa Amerịka bụ Mark Esper si kwuo, ọrụ ndị agha ahụ ga-abụ ịga gbochi ọgbatauhie.
Mana ka ọ dị ugbua, amabeghi ndị agha mmadụ ole a ga-eziga njem ahụ.
Amerịka na Saụdi Arebia na-ebo mba Iran ebubo maka ịtụ ogbunigwe abụọ ahụ, mana otu ndị oyi egwu a kpọrọ Houthi rebels sị na ọ bụ ha tụrụ ya.
Mourinho ọ ga-aga Real Madrid

Ebe foto si, PA Media
Onye nkuzi a ma ama bụ Jose Mourinho agwala ndị mmadụ ka ha ghara ịkpọ ya aha gbasara ịnaghara Zinedine Zidan ọrụ na Real Madrid.
Mourinho gwara ụlọọrụ ntaakụkọ dị na Spen a kpọrọ Deportes Cuatro na Zidan abụghị onye a ga-eleda anya ma abịa na nkuzi bọọlụ.
O kwuru na agbanyeghi otu ihe si kwuru na ihe ajọghị njọ n'otu bọọlụ Real Madrid ugbua dịka ndị mmadụ si eche.
Ọ kọwakwara na ihe ka ya mkpa ugbua bụ ịmụta asụsụ Jamini maka adịghị ama ama o nweta ọrụ na mba ahụ n'ọdinhu.
Asụsụ Jamani ga-abụ asụsụ nke isii Mourinho ma asụ.

Gee nkeji ebe a:

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
- Ndị uweojii akpụpụtala onye ha ji maka ogbugbu ụmụwaanyị na Port Harcourt
- Ihe anyị ji kpọọ oku ka gọọmentị etiti mee Air Peace 'national carrier' - Anambra state Assembly
- 'National Live Stock Transformation Programme' abụghị Ruga - Ọnụ na-ekwuru Umahi
- Ụlọikpe akụpụla akwụkwọ Otti gbara Ikpeazu maka ntuliaka gọvanọ
Ihe nkiri ga-amasị gị:











