Jose Mourinho: Manchester United agbaala onye nkuzi ha ụgbọ nwa mkpi

Mourinho

Ebe foto si, Getty Images

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na Manchester United na Jose Mourinho agbakeela.

Akụkọ ihe a mere sitere n'akwụkwọ ozi otu egwuregwu Manchester United zitere BBC.

N'akwụkwọ mgbasa ozi a John Allen bụ ọnụ na-ekwuru Manchester United zipuru, otu egwuregwu ahụ kelele Mourinho maka ọru ọrụrụ ha, ma na asịkwa ya gaa nke ọma.

Manchester United kwuru na ha ga-ekwu onye ga-anọchite anya Mourinho ruo mgbe agbachara asọmpị nke izu a, dịka ha na eme ka ha họpụta onye ga-abụ onyenkuzi ha.

Mourinho dị afọ 55, ritere "League Cup" nakwa "Europa League" na ọdọ egwuregwu Old Trafford.

Mana ugbua United bụ ndị nke isii na Premier League, dịka ha dị ọnụọgụgụ 19 n'azụ ndị na-achị bụ Liverpool.

Liverpool ji ọkpụ goolu atọ ha satara otu nyụọ ha ịkpakwụ ụbọchị Sọnde.