Premier League: Arsenal n'akwa, Chelsea na Liverpool n'ọchị

Ndị Liverpool na Torreira nke Arsenal

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọtụtu ndị na-ele bọọlụ ọkachasị ndị na-ama aka nke Bekee kpọrọ "Betting", ga-agwa gị na asọmpi nke a gbara n'ụbọchị a bụ Disemba 16, 2018, agaghị etu ha tụwara anya.

A gbawara Arsenal na Manchester United obi, ebe Chelsea na Liverpool bu naanị ọchị si n'ogige egwuregwu laa.

Danny Ings nke Southampton nyere goolu abụọ na nkeji 20 na 44 ebe Henrikh Mkhitaryan nke Arsenal sachara ha na nkeji 28 na 53 mere ka ha hara na goolu abụọ.

Ndị Arsenal

Ebe foto si, Getty Images

Mana goolu Charlie Austin ji isi takpuo na neetị Bernd Leno, nyere Southampton goolu nke atọ mere ka mmeri a na-emeribeghi Arsenal n'ime egwuregwu iri abụọ na abụọ, bịa n'isi njedebe.

Alex Iwobi bụ nwaafọ Naịjirịa na-agbara Arsenal achịtaghị aja n'egwuregwu a mere e ji kpụrụ ya n'ọnụ ruo mgbe a gbachara.

@SageGunner47 kwuru na ọ gaara aka mma ma ọ bụrụ na Arsenal rere Iwobi.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

@ReginaldOhiri kwuru na ọ maghị ihe Iwobi na-agba ga-eme ọ ga-eji eso bido egwuregwu.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ralph Hasenhuttl bụ onye nchịkọta otu Southampton mechara rịọ Unai Emery nke Arsenal arịrịọ maka ichefu ikwe ya n'aka dịka o kwesịrị ime na ngwụcha egwuregwu ahụ.

Liverpool

Liverpool mere Manchester United echeta ebewe ka ha zutere n'Anfield.

Ndị Liverpool nọ n'ọchị

Ebe foto si, Reuters

Sadio Mané nyere goolu na nkeji 24, tupu Jesse Lingard nke Man Utd asaa ya na nkeji 33.

Xherdan Shaqiri e tinyere n'egwu na nkeji 70 gbakara neetị na nkeji 73 na 80, nyere Liverpool mmeri kpọgoro ha n'elu tebulu Premier League.

Chelsea

Pedro bu ụzọ gbakaa neetị ndị Brighton ka Eden Hazard bunyere ya nri chinyere na nkeji 17.

Na-erughi nkeji 17 ọzọ, ka a gbaruru bọọlụ na nkeji 33, Hazard n'onwe ya agbakaa neetị ndị Brighton.

Hazard

Ebe foto si, EPA

Ka a batara ọkara nke abụọ, Solly March agbakaa neetị Kepa Arrizabalaga, satara ndị Brighton otu goolu.

Mmeri Chelsea meriri ha n'asọmpi a, mere ya ugboro abụọ ha ga-emeri ka ha zutere na Premier League n'afọ a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: