Ihe a gbatara na Premier League: Arsenal enwetala mmeri mbụ ha n'okpuru Unai Emery

Ebe foto si, Reuters
Arsenal nwetara mmeri mbụ ha kemgbe Unai Emery bidoro ịchịkọta ha, ebe mmeri Liverpool meriri Brighton mere ka ha were pọintị abụọ na-aga ndị na-esote ha n'elu tebulu Premier League.
E nyere Richarlison na-agba Everton bọolụ akwụkwọ ọbara ọbara ma chụpụ ya ka ha na Bournemouth gbara onye laba onye laba (2-2).
A chụpụkwara Adam Smith bụ onye Bournemouth, nke pụtara na ha na Everton ezughị ezu wee gbachaa egwuregwu nke taa.
Leicester City n'onwe ha meriri Southampton (2-1), ebe a chụpụrụ Pierre-Emile Hojbjerg na-agbara Southampton ka ọ natara akwụkwọ edo edo abụọ.
Enweghị onye meriri ibe ya n'etiti Huddersfield na Cardiff, n'agbanyeghị na a chụpụrụ otu onye Huddersfield (0-0).
Ndị Wolverhampton mere Manchester City bụ ndị buliri iko Premier League n'afọ gara aga ihe tụrụ ha n'anya taa ka ha na ha gbara onye laba onye laba (1-1).





