Premier League: Ihe ndị Naịjirịa ritere n'asọmpi a

Kelechi Iheanacho

Ebe foto si, PA

Nkọwa foto, Kelechi Iheanacho na ụmụnne ya na Premier League achịtaghị aja ọfụma

Onweghi onye Naịjirịa ọbụla nyere goolu taa (bụ Satọde, ụbọchị nke iri nke ọnwa Nọvemba) n'asọmpi niile agbara n'egwuregwu Premier League.

Leon Balogun zuru ike n'oche ka ndị otu ya bụ Brighton natara ụtalị 2-1 n'aka ndị Cardiff City.

Balogun adịghị ahụ bọọlụ gbaa kemgbe o si Jamanị gawa Ịngland.

Isaac Success hụrụ bọọlụ gbaa mgbe Watford natara nhatanha 1-1 n'asọmpi ha na Southampton.

Na Leicester City, Kelechi Iheanacho sọrọ mpi mana ha enweteghị mmeri n'asọmpi a ha ji kwanyere onye nwe ha nwụrụ na nso a ugwu.

Iheanacho batara n'ime nkeji 60 na ya bụ asọmpi mana mbọ ya niile enyeghi Leicester mmeri.

Ihe agbatara na Premier League ụbọchị Nọvemba 10

Cardiff City 2 - 1 Brighton & Hove Albion

Huddersfield Town 1 - 1 West Ham United

Leicester City 0 - 0 Burnley

Newcastle United 2 - 1 AFC Bournemouth

Southampton 1 - 1 Watford