Pogba na Mourinho ana-ama aka?

Pogba na Mourinho

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

N'izu gara aga oge Manchester United ji ọkpụ abụọ a satara otu merie otu egwuregwu Leicester City, onye nchikọta otu bọọlụ Man.Utd bụ Jose Mourinho toro Pogba, wee sị na aka ya dị na mmeri ahụ ha meriri.

Pogba nyere otu goolu n'ime abụọ ha ji merie n'asompi mbụ nke Premier League n'afọ ọhụrụ a.

Mana okwu Pogba kwuru na Twitter gosiri na obi adịghị ya mma, nakwa gosi na ihe amaghị na-eme n'etiti ya na onye nchikọta otu ahụ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Pogba gwakwara ndị ntakụkọ sị, "Ọ bụrụ na obi adịghị gị mma, ị gaghị etinye obi gị niile n'ihe ị na-eme.

"O nwere ihe m ga-ekwu, e rie m iwu maọbụ nha."

O kwukwara na "onye egwu ga-agba bọọlụ karịa ma ọ bụrụ na ọ nọdụ ọfụma ma na-enwekwa aṅụrị.'

Okwu ya mere ka ndị na-eso ihe na-eme n'egwuregwu na-ekwu na o nwere ike, Mourinho apụọrọ ya na Man Utd.

Sam Wallace bụ onye ntaakụkọ ụlọakụkọ Telegraph kwuru na e nwere mmadụ atọ kachasị ike n'otu egwu bọọlụ ahụ; onye nhazi otu egwu bọọlụ Manchester bụ Ed Woodward, onye nchịkọta ha bụ Jose Mourinho na onye egwu bọọlụ ọkachaibe ha bụ Paul Pogba; mana onye kachasị ghara inwe ike n'ime ha bụ Mourinho."

Pogba so ndị mba ya bụ France wee bulie Iko Mbaụwa nke 2018 a ka gbachara na Rọshịa.

Ọ bụ onye bọọlụ akachasị akwụ ụgwọ n'otu egwu ndị England dịka Man. Utd si n'aka Juventus goro ya n'ọnụ nde £89.3.

Mana akụkọ kwuru na n'afọ gara aga, ọ gbara mbọ ịpụ gawa Barcelona.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ