Abịa Gọvernorship Election: Ikpeazu emeriela Otti n'ụlọikpe ntuliaka

Ebe foto si, Otti/ Ikpeazu
Alex Otti bụ onye zọrọ ọkwa gọvanọ Abịa steeti n'aha otu Apga ekwuola na ya anabataghị mkpebi ụlọikpe ntuliaka kpebiri n'ụbọchị Friade.
Ụlọikpe ntuliaka nọrọ n'ụmụahịa were kụpụ akwụkwọ nke Alex Otti gbara iji gbagha mmeri Okezie Ikpeazu Nke PDP meriri na ntuliaka e mere na abali itoolu nke ọnwa Maach na steeti ahụ.
Jọstis Lekan Ogumonye onye bụ onyeisi ụlọikpe ahụ kụpụrụ arịrịọ niile Otti rịrọ ma kwuo na o gosighị ihe akaebe doro anya na ebubo ndị o boro bụ eziokwu.
Mana Otti si na mkpebi ahụ adabaghị.
Otti onye kwuru nke a site n'ọnụ na-ekwuru ya bụ Kazie Uko gwara BBC sị "A nabataghị mkpebi ahụ."
"Ndị ọkaiwu anyị na-atụle akwụkwọ mkpebi ahụ tupu e kpebie ihe ga-eme."
Mgbanwe ihu igwe na-aka njọ

Ọtụtụ ndị na-agba mbọ maka nchekwa gburugburu emeela ngagharịiwe na legos, Abuja na Pọtakọt ụbọchị Fraide maka mgbanwe ihu igwe nke Bekee kpọrọ "Climate Change.
Ha tụrụ arịrị na oke idemmiri na-agba ike n'ebe dị iche iche na Naijiria so na nsogbu mgbanwe ihu igwe na-ebute.
Na mba ofesi,

Ebe foto si, AFP
A chọtala Peter Magombeyi bụ onyeisi otu ndị dọkịta na mba Zimbabwe nke e chere na a tọrọ na Satọde gara aga
Mana gọọmentị mba ahụ na-ekwu na ntọ ya na nchọta ya dịka ihe a kpara akpa.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Otu AC Milan ehiwela otu ga-ahụ na ndị mmadụ ag aghị akpa oke agbụrụ n'asọmpị ha ga-agba na ngwụcha izuụka a.
Onyeisi otu ahụ bụ Ivan Gazidis sị na o kwetara na otu ya kwesiri ịtịnye ọnụ ma gbanwee echiche ndị mmadụ gbasara ịkpa oke agbụrụ n'egwuregwu bọọlụ
Gee Nkeji ebe a
Onyeisiala Buhari ga-apụ gawa ọgbakọ United Nations

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari ga-ahapụ Naịjirịa n'ụbọchị Sọnde gawa ọgbakọ United Nations nke iri asaa na anọ na New York, mba Amerịka.
Buhari ga-abụ onye nke ise ga-ekwu okwu n'ọgbakọ a.
Cheta na e mere nwaafọ Naịjirịa bụ Tijani Muhammad-Bande onyeisioche ọgbakọ a n'onwa June 2019.
N'aka nke ọzọ Ministrị na-ahụ maka mmiri ga-eme ihe ngosị gbasara idebe onwe na ezi ọcha
Nke a na-atụ anya ga-eme ka ndị mba ọzo agbatara Naijirịa ọsọ enyemaka i ji kwụsị i ga mposị n'ezi.
Aka akparala onye e che na-egbu ụmụnwaanyị na Pọtakọt

Ebe foto si, NIGERIAN POLICE FORCE
Ndị uweojii egosila otu nwoke ha sị na ha che n'aka ya dị na ogbugbu ụmụnwaanyị n'ụlọ ndina na Pọtakọt, Rivas steeti .
Ha sị na nwoke ahụ bụ onye Rivas Steeti si na okpuru ọchichị Buguma ma bụrụ kwa ọnye otu nzuzu akpọrọ debam.
Nwoke a mere onye nke atọ ụweojii jidere maka echiche na aka ha dị na ogbugbu mmadụ a.
N'Ofesi

Ebe foto si, EPA
Praịm Minista mba Iraq bụ Adel Abdul Mahdi adọọla aka na ntị ka egbochie ihe ọbụla ga-eme ga mba Amerika na Saudi Arabia lusoo mba Iran agha.
O kwuru na agha dị otu a ga-agbasa karịa etu esi tụọ anya ma kwukwa na ohere dị ka achọọ ụzọ ụdo.
N'Egwuregwu

Ebe foto si, Reuters
N'asọmpi Ụropa agbara ụnyaaahụ ndị Manchester United ji otu ọkpụ goolu merie FC Asanta, Ebe ndị Arsenal ji ọkpụ goolu atọ asataghị otu gbaa Frankfurt ose n'ụlo ha ma ndị Sporting Braga ji otu goolu merie ndị Wolves n'ụlo ha.










