Nwoke kwere ka agwọ 200 taa ya iji chọta ọgwụ agwọ maka mbaụwa

A black mamba biting Tim Friede

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nanị ntụsa onunu agwọ ojii mamba abụọ nwere ike igbu mmadụ
    • Onye dere ya, Swaminathan Natarajan
    • Ndị mere akụkọ a, BBC World Service

Kwa nkeji ise ọbụla, otu onye nọ otu ebe na-anwụ site n'arụ agwọ tara ya, ebe mmadụ anọ nwere ike ibute ọrụsị site n'arụ agwọ.

Mana o nwere ụfọdụ ndị kara obi jiri agwọ eme nchọpụta.

Tim Friede, onye bi na Wisconsin dị na mba Amerịka sere onwe ya ihe onyonyo ebe ọ kpachara anya hapụ ka agwọ ọjọọ taa ya ma tinyekwa ihe onyonyo ndị a na 'Youtube.'

Ihe ụfụ ozigbo ozigbo

Ebe aka Tim Friede abụọ na-agba ọbara site na agwọ tara ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mgbe ụfọdụ Tim Friede na-akọwara ndị na-ekiri ya na YouTube etu ọ na-adị ma agwọ ọjọọ taa mmadụ

N'otu ihe nkiri a, ka agwọ ọjọọ a kpọrọ mamba tachara ya, ọ gbara ọbara na-apụ ya n'aka nkịtị na-ekwunye okwu n'igwe na-ese ihe onyonyo.

"A bịa n'agwọ ojii mamba, ụfụ ya na-abịa ozugbo. Ọ na-adị ka otu puku aṅụ ịgba mmadụ. Aṅụ na-enwe onunu inu (venom) otu miligram maọbụ abụọ mana agwọ 'mamba' taa gị, o nwere onunu inu ruru narị miligram atọ maobu nari ise (300-500 milligrams.)"

Ọ gwara BBC ihe mezịrị:

O kwuru sị, "O bidoro zawa azawa ka nke a mechara. Ụbọchi ole na ole na-eso ya, o jituru m. Site n'ụdị ọziza ọ zara m nwere ike ikwunwụ onunu inu ole agwọ ahụ tanyere m n'ahụ. Ọ fụrụ m ezigbo ụfụ."

Ọ dị oke egwu, o zighị ezi

Mana ọ bụghị onye ọbụla ka ihe na-atụ n'anya dịka o si atụ ndị ihe ya na-amasị na YouTube.

Tim Friede ebe agwọ na-ata ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Tim Friede sị na ahụ ya etichiela nke na onunu inu agwọ agaghị emeli ya ihe ọbụla

Dkta Stuart Ainsworth nke si n'ụlọakwụkwọ 'Liverpool School of Tropical Medicine' kwuru na "Ihe ndị a na-eme edoghị anyị anya. O zighị ezi. Nnukwu egwu dịkwa na ya. Anyị na ha anaghị arụkọ."

Ụlọ mmụta ya so na ndị na-achọ ọgwụ agwọ ozuru mba ọnụ ọhụrụ.

Ihe na-eme bụ na a na-ebu ụzọ tulee ọgwụ mgbochi ọhụrụ n'ahụ oke na ụmụ anụmanụ ndị ọzọ.

Ọ bụ naanị oge o doro anya na ọ gaghị emerụ mmadụ ahụ ka a na-atụle ya n'ahụ mmadụ.

Dkta Ainsworth sị,"Ndị mmadụ nwere ike inweta ọdaeshi agwọ site n'ime ka agwọ taa ha n'ihi na o nweghị iwu mabidoro ya. Mana ụdị ihe nwere ike ibute ọnwụ. Mmadụ ekwesịghị ime ya."

Mana n'ụlọrụ na-emepụta ọgwụ agwọ niile dị na mbaụwa, e nweghị ntụziaka etu o kwesịrị ka e si na-eme nchọpụta maka ọgwụ agwọ

Dịka 'Wellcome Trust', otu mba Briten anya ha dị n'imepụta ọgwụ mgbochi ọhụrụ si kwuo, "E nweghị usoro mmepụta, nchekwa maọbụ nhazi zuru ọnụ onye ọbụla na-agbaso."

Ikwe ọnwụ ọnụ

Friede kwusiri ike na ọ bụghị eziokwu na ya n'etinye ndụ ya n'ọnụ ọnwụ iji nweta ndị na-eso ya na soshal midia.

"E meghị m ya iji mee ihe onyonyo YouTube - Achọrọ m ịzọ ndụ nakwa ime ihe pụrụ iche na ndụ ndị mmadụ.

"Eji m YouTube achọ ndị dọkịta mụ na ha ga-arụkọ. Ọ bụ ihe a maghị ma ọ ga-enwe isi. O nweela isi."

Tim Friede ebe ọ na-egosi agwọ ọ na-azụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Tim Friede kwuru na ya eruola ọnụ ọnwụ site n'arụ agwọ ugboro iri na abụọ

N'ime ụdị agwọ ruru 3,000, naani 200 nwere onunu inu kajara akaja nke nwere ike igbu mmadụ maọbụ kụọ ya ngwụrọ. Friede macha ha niile.

Ọ masị ya bụrụ nke a kpọrọ 'cobra, 'viper' maọbụ 'mamba', o diela ụfụ arụ agwọ tara ya n'afọ iri abụọ.

Nke a gbakwụnyere ugboro 700 ọ gbanyere onwe ya onunu inu agwọ n'ahụ.

Oke onunu inu agwọ nwere ike ịtanye mmadụ na-adị icheiche. Ụfọdụ, agwọ nwere ike ịta gị na-agbanyeghị gị onunu inụ ọbụla n'ime.

Friede sị, "Ọ bụrụ na ahụ gị etichibeghị n'ebe agwọ dịka mamba nọ, o nwere ike ime ka ekoume (diaphragm) gị nke na ị gaghị ekuli ume. Anya gị agaghị ekwe mmepe, ị gaghị ekwuli okwu, ị ga na-agba ruo oge ahụ gị kpọnwụrụ mana uche gị ka ga na-arụ ọrụ ganye ma ị nwụọ."

Arụ 'Cobra' dị ọjọọ nke ukwuu

Friede na-azụ ọtụtụ ajọ agwọ n'azụ ụlọ ya ma na-anwale ọtịta ha n'ahụ ya.

Agwọ ojii

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Agwọ ojii 'mamba' bụ otu na-agwọ kachasí jọọ njọ - arụ ya na-egbu mmadụ tupu o rue nkeji 30 ọ tara mmadụ

"E nwere m agwọ cobra mmiri m si Afrịka nweta. Arụ ya na-adị egwu. Ọ na-eyi egwu."

Friede nwere nkwenye na ị na-agba onwe gị onunu inu nwayọ nwayọ, ahụ gị ga-etichi ghọọ ọdaeshi n'ebe agwọ ọjọọ nọ mana a katọrọ usoro ọ na-agbaso.

Inweta 'ọdaeshi' agwọ

Ọ bụ ịgbaso ụzọ yiri ya nke e ji ụmụanụmanụ eme nyere aka ka e nweta ọgwụ agwọ nke a eji agwọ arụ agwọ ugbua.

Onye ji agwọ eme anwansi na mba Pakistan

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A na-atụ agwọ egwu ma na-efe ya n'ọtụtụ mba

Mmepụta ọgwụ agwọ enwebeghị nnukwu mgbanwe kemgbe '19th Century'.

A na-agbanye nsị agwọ ya bụ onunu inu agwọ n'ahụ anyịnya maọbụ atụrụ ma mịpụta mgbochi ọbara ha ga-amụpụta.

Friede sị, "Anyị nwere anụmanụ ndị chọrọ igbu m mana achọghị m ịnwụ. Ya mere aghọ m anyịnya. Kedụ ihe bụ na-anyị agaghị echekwa onwe anyị?"

Friede , onye gbara afọ iri ise abụghị ọkammụta maka nchekwa ahụ nke ọ na-aga mahadum.

Ọ bụ egwu agwọ ọjọọ ịtagbu ya mere ya dabanye na ime ihe o bidoro ime kemgbe afọ 20 gara aga.

O bidoro na ududo na akpị were si na ha fere n'agwọ ọjọọ.

"Ọ bụghị agwọ niile ka m nwalerela. Ana m ahọrọ ndị na-egbu ngwangwa."

O nwere ọtụtụ apa si na nwale o merela, oruela n'ọnụ ọnwụ ọtụtụ mgbe.

Mana ọ na-enye ya aṅụrị na agwọ ịta ya, o nwetakwa onwe ya na ahụghị dọkta.

"Ihe dịka ugboro 12 , inwetakwa onwe m rịara ahụ. n'otu nwale m mere n'afọ mbụ, ebugara m ụlọọgwụ eebe m hiri ka agwọ 'cọbra abụọ tachara m."

"Ị ga-amụta ihe. O nweghị dọkịta maọbụ mahadum n'ụwa a ga-akụziri gị nke a."

Agwọ cọbra a na-apịpụta onunu inu ya

Ebe foto si, Swaminathan Natarajan

Nkọwa foto, Ọgwụ agwọ na-ada oke ọnụahịa ma nwekwa ike ibute nsogbu ndị ọzọ

Onye ọrụ nchekwa ahụ(immunologist a kpọrọ Jacob Glanville hụrụ ihe Tim Friede na-eme n'ihe onyonyo dị na YouTube kpọtụụ ya.

Ugbua, ụlọụ ya na Friede na-agba mbọ irụpụta ọgwụ agwọ pụrụ iche nke ha ji ihe si n'ihe ha mịtara n'ọbara Friede.

"Ihe Tim mere dị ịtụnanya mana ọ dịkwa egwu. Agaghị asị onye ọbụla ga-eme ụdị ihe a."

Ọrịa ndị e chezọrọ echezọ

Dịka WHO siri kwuo,kwa afọ, agwọ na-ata mmadụ ruru nde ise na ụma anọ ( 5.4 million). Ndị na-anwụ na-eru bido na 81,000 rue 138,000.

Ihe karịrị 400,000 bụ ndị na-esi narụ agwọ bute ọrụsị na-ebudata ụdị ndụ ha na-ebi.

Agwọ 'viper' nọ n'akịrịka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, N'akụkụ ụwa dị icheiche, mmadụ na agwọ na-ebiko

Ụbọchị 19 nke ọnwa Septemba kwa afọ bụ ụbọchị e ji agbasa ozi maka arụ agwọ.

Nke a bụ ji mee ka ọhaneze lenye anya na nsogbua na-akpa ike na obodo dịga n'Afrịka, Asia nakwa South-Amerịka.

N'ọtụtụ mba, ọgwụ agwọ e nwere anaghị arụcha ọrụ n'ihi etu e siri dokwaa ya maọbụ maka na e mere ya maka ụdị agwọ pụrụ iche , ọ bụghị agwọ niile.

Iji isiike gboo mkpa

Ọtụtụ ndị ọkammụta sayensị akatọọla Glanville na Friede maka ihe =ha na-eme mana ha kwusiri ike na nchọpụta ha na-eme.

Tim Friede tnọ n'ụlọ ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Tim Friede sị na nnwale kara aka bụ maka ọdịmma ụwa

Glanville sị, "Anyị elebanyela anya n'ọrụ ji usoro e ji elebanye ihe ndị ọịzọ nwere ike itinye mmadụ na nnukwu nsogbu dịka mmerụ ahụ n'ọrụ maọbụ HIV."

Dịka o kwetara na ụzọ ọ gbaso agaghị adịị ndị ọzọ mfe, Tim Friede sịrị na ọ ga-amịta mkpụrụ.

"O nwere uru dị n'ekweghị ekwe m. Ana m etinye ndụ n'ihe egwu iji nwetara ụwa ọgwụ agwọ ozurumba ga-adị ọnụala."