Alex Otti: Anyị ga-ahụ na anyị chekwara vootu niile a tụọrọ anyị

Aha onyonyo, 'Anyị mụzị anya ugbua'

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Alex Otti, bụ onye na-azọ ọkwa Gọvanọ Abia na ntuliaka 2019 n'okpuru otu pati All Progressives Grand Alliance (APGA), kwuru na ya mụzị anya iji gbalahụ ihe mere ya na 2015.

Otti kwuru na 'ndị ohi zuru mmeri n'afọ 2015.'

Mana Kọmishọna mgbasaozi na steeti ahụ ahụ bụ John Okiyi kwuru na okwu Otti bụ okwu ụgha.

Dịka Okiyi siri kwuo, Otti gara ụlọikpe ịgbagha mmeri meriri ya mana mbọ ya kpụrụ afọ n'ala.

Akụkọ ga masị gị: