Election 2019: E meghi ezigbo ntuliaka n'Abia Steeti - Alex Otti
Alex Otti ji aha pati APGA zọọ ọkwa gọvanọ n'Abia Steeti ekwuola na ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere na steeti ahụ jụpụtara na nrụrụaka.
Na mkparịta ụka ya na BBC Igbo nwere, Otti kwuru na ndị ọtụ INEC na ndị nchekwa rụrụ PDP ọrụ.
Ọ gara n'ihu kọwaa na mpụtara ntuliaka ahụ abụghị ihe ndị mmadụ tụtara na vootu.
Otti kwuru na dịka ọ dị ugbua, na ndị otu ya ka na-eme nyocha iji kpebie ma ha ọ ga-aga n'ụlọikpe maa mpụtara ahụ aka.
Gee ihe ndị o kwuru n'uju ebe a:



