Election 2019: E meghi ezigbo ntuliaka n'Abia Steeti - Alex Otti

Aha onyonyo, Iwe mpụtara ntuliaka Gọvanọ jị Alex Otti

Alex Otti ji aha pati APGA zọọ ọkwa gọvanọ n'Abia Steeti ekwuola na ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere na steeti ahụ jụpụtara na nrụrụaka.

Na mkparịta ụka ya na BBC Igbo nwere, Otti kwuru na ndị ọtụ INEC na ndị nchekwa rụrụ PDP ọrụ.

Ọ gara n'ihu kọwaa na mpụtara ntuliaka ahụ abụghị ihe ndị mmadụ tụtara na vootu.

Otti kwuru na dịka ọ dị ugbua, na ndị otu ya ka na-eme nyocha iji kpebie ma ha ọ ga-aga n'ụlọikpe maa mpụtara ahụ aka.

Gee ihe ndị o kwuru n'uju ebe a:

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: