Jose Mourinho: Ndị otu egwuregwu na-achụzịm
Akụkọ dị mkpa taa

Ebe foto si, Getty Images
Onye bụbu onye nchịkọta otu Manchester United akọwala na ya enwetala ozi ọrụ ruru atọ mana o nweghi nke ọ nara.
Cheta na otu Manchester chụrụ ya n'ọrụ dịka onye ndụ n'ọnwa dizemba afọ gara aga.
O kwukwara na ndị egwuregwu bọọlụ nke agba ọhụrụ adịghị ka ndị ogbo nke mgbe ochie.
"Anaghị m a park bus" ka o kwuru.
N'okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị

Ebe foto si, Atiku Abubakar
Ndị mmadụ ataala onye na-azọ ọkwa onyeisiala bụ Atiku Abubakar ụta ihe o jighi sonye na nrụrịtaụka nke ọkwa onyeisiala emere na mgbede ụbọchị satọde
Atiku zọrọ isi onwe ya na-ekwu n'agbanyeghi na ọ bịara n'ọdọ nrụrịtaụka ahụ, o sonyeghi n'ihi na onyeisiala Muhammadu Buhari n'onwe ya abịaghị
Ebe Onyeisiala Buhari n'onwe ya na-akọwa na ọ bịaghị na ya bụ nrụrịtaụka maka na ọ bataghị Abuja n'oge dịka o gara ọrụ achụmnta vootu na steeti abụọ ndị ọzọ
Sọsọ Oby Ezekwesili, Kingsley Moghalu na Fela Durotoye sonyere na ya bụ nrụrịtaụka.
Gụọ ya n'uju ebe a: Buhari: Ihe mere m ejighi sonye na nrụrịtaụka
Na mba ofesi

Ebe foto si, Reuters
Otu ụlọikpe dabere n'akwụkwọ iwu mba Kongo ekwezuola na ọ bụ Felix Tshisekedi meriri ntụlịaka emere n'obodo ahụ n'ọnwa disemba afọ 2018.
Nke a pụtara na ha jụrụ mkpesa Martin Faylu na ndị ọzọ zọrọ ya bụ ọkwa mere iji tụgharị mmeri Tshisekedi.
Akụkọ niile dị mkpa n'otu nkeji










