UEFA Champions League: Liverpool na Chelsea esitela mmeri n'ọnwụ

Ebe foto si, Getty Images
Agba ekperechi ka otu egwu bọọlụ Liverpool nke mba Ịngland ji merie ndị RB Salsburg nke mba Austria.
Obere ihe ka ọ fọdụrụ ka ndị Liverpool nọrọ na mmiri ncha abaa ha anya.
Ha jibu ọkpụ goolu atọ emeri na asọmpi ahụ.
Ndị nyeere Liverpool goolu bụ Sadio Mane, Andrew Robertson na Sala.
Mana ndị Salsburg mechara sachaa goolu ahụ niile.
Na nkeji 69 ka Sala nyekwara goolu ọzọ iji mee ka ndị otu ya turu ugo.

Ebe foto si, PA Media
N'otu aka ahụ kwa, ndị otu egwu bọọlụ Chelsea ji ịta ikikiri eze wee merie ndị Lille nke mba Fransị.
Ọkpụ goolu abụọ asatara otu ka Chelse ji turu ugo.
Ụmụafọ Naịjiria abụọ nyere goolu n'asọmpi ahụ.
Victor Osimhen nyere goolu nke ndị Lille ebe Tammy Abraham nyere nke ndị Chelsea.
Willian bụ onye nyere goolu nke abụọ wee nye Chelsea mmeri.
Abraham bụ nwaafọ Naịjiria mana ọgbabeghịrị Naịjiria bọọlụ mbụ.
A na-atụ anya na ọbụ mba Ịngland ka o nwere ike ịgbara.

Ebe foto si, EPA
Otu egwu Barcelona jisikwa ike merie ndị Inter Milan na be ha n'ụbọchị Wenezde.
Ha jikwa ọkpụ goolu abụọ asatara otu wee merie.
N'asọmpị ndị ọzọ, Lyon meriri Leipzig 2-1, Dortmund meriri Slavia Prague 2-0.
Napoli na KRC Genk gbara 0-0, ebe Ajax meriri Valencia 3-0.
Ka ọ dị ugbua, Liverpool enwetala akara atọ maka ebe Chelsea nwere naanị otu akara.
Cheta na ndị Napoli meriri Liverpool n'asọmpi Champiọns league nke mbụ nke afọ 2019/2020.
Valencia jikwa otu ọkpụ goolu merie Chelsea n'oge gara aga.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:









