Ballon d'Or: Luka Modric anarala Messi na Ronaldo ụra

Luka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Luka Modric na-agbara otu Real Madrid bọọlụ

Onye otu Real Madrid nakwa onye na-agba n'etiti otu egwuregwu Croatia bụ Luka Modric etụrụla ugo Ballon D'or nke afọ 2018.

Modric bụ onye nke mbụ ritegoro nturugo a kamgbe afọ iri Lionel Messi maọbụ Cristiano Ronaldo ritewerela ya.

Modric dị afọ iri atọ na atọ ritere nturu ugo nke Champion League nke ugboro atọ n'ahịrị tupu onyere Croatia aka mabute iko mba ụwa nke mbụ ha.

Luka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nke a bụ nke mbụ Luka na-etụrụ ugo a kamgbe afọ iri Ronaldo na Messi na-erite ya.

N'afọ 2007, ọ bụ onye otu egwuregwu Brazil mabụrụkwa onye na-agbara AC Milan akpọrọ Kaka turu ya bụ ugo karịa Messi maọbụ Ronaldo.

Ronaldo onye nke batara otu egwuregwu Juventus sị Real Madrid n'ọkọchị gbara onye nke abụọ n'afọ ahụ.

Messi onye na-agbara otu egwuregwu bọọlụ Barcelona gbara onye ise, ebe Antoine Griezmann (onye otu Atletico Madrid) nakwa Kylian Mbappe ( PSG) ma bụrụkwa ndị ritere France iko mba ụwa gbara

onye nke atọ na anọ otu aka ahụ.

Mbappe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Kylian Mbappe gbara onye nke anọ na ya bụ nturuugo

Mmadụ iri mbụ meriri na Ballon d'Or 2018

1. Luka Modric (Real Madrid and Croatia)

2. Cristiano Ronaldo (Juventus and Portugal)

3. Antoine Griezmann (Atletico Madrid and France)

4. Kylian Mbappe (Paris St-Germain and France)

5. Lionel Messi (Barcelona and Argentina)

6. Mohamed Salah (Liverpool and Egypt)

7. Raphael Varane (Real Madrid and France)

8. Eden Hazard (Chelsea and Belgium)

9. Kevin de Bruyne (Manchester City and Belgium)

10. Harry Kane (Tottenham and England)

Akụkọ ndị ga-amasị gị: