Nigerian Foods: Lekwa ihe ndị ọzọ ị ga-eji ede esi

Ofe onugbu

Ebe foto si, Ntanta soups

    • Onye dere ya, Chimezie UcheAgbo
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Chineke jiri ji na-ede were gọzie ndị Igbo. Obodo dị iche iche nwere ụdị ede dị iche iche nke a e nweghi ike ịmatacha.

Ndị dị iche iche nwere aha ha na-akpọ ede nke ha mara n'olu ha.

Ọtụtụ amaghị na ede na-azọ Igbo ndụ kamgbe afọ kpirigidim.

Mana n'oge ugbua, onye ọbụla ị kpara aka n'ọnụ jụọ ya ihe e ji ede eme, ọ ga-asị gị na ọ bụ ofe ka eji ya arọ mana ọ bụkwanụ naanị ya ka ede pụtara ụwa ịrụ?

Mbanụ, ị makwa na e nwereike iji ede sie ụzọ nri ise?

Tupu anyị abanye na ya bụ nrị, ka anyị buru ụzọ gwa gị na ede dị n'ụdị n'ụdị.

Ede

Ebe foto si, Utakaegbe

Ede dị n'ụdị n'ụdị

Mpaghara ala Igbo dị icheiche nwere aha ha na-akpọ ede n'asụsụ ha.

  • Ede arọ maọbụ ede ụrị
  • Ede agbọkwe maọbụ agbakara
  • Ede ọbara
  • Ede ọcha
  • Rụka m ma avụka gị
  • Vụka m ma arụka gị

Nke a abụghịkwa ihe a na-akpọ ya n'asụsụ niile, nke a bụ n'asụsụ ndị Owere. E nwekwaraike inwe ihe dị iche unu na-akpọ ya.

ofe na-asụ asụ

Ebe foto si, utakaegbe

Nkọwa foto, Ofe onugbu eji ede tee

Gịnị ka ede na-enye n'ahụ?

Nyocha dị icheiche na-ekwu na ede nwere ọtụtụ ihe dị na ya mere o jiri magbuo onwe ya iri ya.

O nwere Kalsum, protin, vaitamin A na E na K na C.

O nwekwara Sodiom na potashum na ayọn nawa ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

Ofe onugbu

Ebe foto si, Ntanta soups

Ugbua, ka anyị banyezie n'ụfọdụ ihe ndị ị ga-eji ede sie.

Ihe ndị e ji ede esi

1. Ofe ede - Onye ọbụla bụ onye Igbo eriela otu ofe e ji ede sie.

ede a sụrụ asụ

Ebe foto si, utakaegbe

Nkọwa foto, ede a sụrụ asụ

Nke a bụ eziokwu bụ na otu n'ime ofe ndị e ji ede esi na-amasịrịrị onye Igbo ọbụla, ọ bụghị nke a, ọ bụrụ nke ọzọ.

I che na ọ bụ asị, jụọ onye nọ gị n'akụkụ ofe kacha amasị ya, ọ bụghị ofe onugbu, ọ bụrụ ofe ọha.

Ede bụ ihe na-eme na ofe ndị a, na-alọ alọ ghara ịdị mmiri mmiri.

Ọ na-eme ofe, anya richaa, ọnụ e rie.

2. Ede a gwọrọ agwọ

Ụfọdụ na-eche na ọ bụ naanị ji maọbụ jioko maọbụ ogede ka a na-agwọ agwo, mba nụ, i nwekwara ike ịgwọ ede agwọ.

Ede e ji eshi nke a bụ nke a na-akpọ ede agbọkwe maọbụ agbakara.

Etu e si agwọ ya

Bachaa ede gị sinye ya 'ọkụ, tinye ya mmanụ, benye ya yabasị, tinye ya isha na ose na nnu, hapụ ha niile ka ọ sụkọọ.

Ọ na-asụ, ị na-eleta ya ka ị mara mgbe ọ ga-eghe, na-ayakwa ya.

O ghee, i tinye ya ncheanwụ maọbụ ụgụ, nke ọbụla akpịrị gị gwara gị.

3. Achịcha

Ụfọdụ oge, ihe ga-agụ mmadụ bụ nnọ nri ndị ahụ ndị nne oche siri, achịcha bụ ọtụ n'ime ha.

Ọ bụkwa nri ndị Enugwu mana ọ dịka ọ na-amasịzịkwa Igbo niile.

Nke a bụ ede a mịkpọrọ amịkpọ n'oge ụgụrụ ka e ji fịọ fịọ maọbụ akịdị eshi.

Etu e ji esi ya

Were ikwe kurisie ede ahụ (achịcha) rue mgbe ọ dị kịrị kịrị, i mesịa, ị banye ya na mmiri rue mgbe ọ ga-ede.

Ekwela ka o dee mmiri karịa, ị sachaa ya ugboro ugboro itinye ya n'ime akpa fịrị fịrị kechie ya sinye ya na fịọ fịọ maọbụ akịdị ị họrọ ahọ.

Ekwela ka mmiri banye n'ime achịcha ahụ. Oge akịdị ahụ ghere, i butuo ya sie mmadụ na nnukwute yabasị, ụgba na ezigbo ose na ekpo ọfụma, tinye ya nnu jiri gwọkọọ achịcha ahụ na akịdị.

Ị chọọ, i tinye ya ncheanwụ, i risie nke a, ị mịchaa aka.

achịcha

Ebe foto si, Nwadioramma

4. Ede na mmanụ maọọbụ ngụ

I nwekwara ike sie ede agbọkwe tinye nnu na mmanụ jiri ya tụọ ndụ mmanụ maka na ọ bụghị mgbe niile ka mmadụ na-achọ nri ndị ofeke maọbụ ndị e bitere ebite.

5. Ụtara ede

I nwekwara ike iji ede mere ụtara sụọ ya etu e si asụ ji maọbụ akpụ.

Ị chọrọ imeta onye Nnewi mma ọkachasị onye okenye, siere ya ụtara ede na ofe ọha, Ị mara na i ruola n'isi mmiri.

Ọzọkwa bụ na ede enweghi ụdị shuga ji nwere, mere o ji dị mma maka ndị na-arịa ọrịa shuga.

6. Ede e ghere eghe

Ee! A na-eghe ede eghe jiri ya mee ihe ntagharị ọnụ maọbụ ihe e ji ele ọbịa.

Ede e ghere eghe

Ebe foto si, Supertongue Concepts

Nkọwa foto, Ede e ghere eghe

Makwara na e jikwa akwụkwọ ede nke ndị Nsụka na-akpọ opoto esi ofe jirikwa okporo ya etinye n'ofe.

E berisie okporo ya, kpaa ya n'anwụ, ọ kpọọ nkụ, e jiri ya mee ihe mgbakwunye n'ofe ọgbọnọ.

Ndị Isi-Ụzọ n'Enugwu na-akpọ ya 'kpụrụ kpụrụ'.

akwụkwọ ede

Ebe foto si, Utakegbe

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ọgba mbọ: "Ihe niile nwoke na-eme nwaanyị ga-eme ya karịa"