Nigerian Foods: Onye afọ nri! Lekwa ihe mere ụtọ agwa ji aba n'ụmị

Ebe foto si, Matsecooks
- Onye dere ya, Chigozie Ohaka
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo service
Onye ọbụla nrị na-amasị ma na agwa bụ asa na nrị. Eziokwu agwa bụrụ nwaanyị ọ ga-abụ asa dị egwu. Otụtụ nrị eji agwa esi nke mere na ị jụọ mụ, m ga-asị gi na agwa bụ oyoyo na nrị.
Ndị afọ nrị nille ma na agwa na-edozi ahụ ma na enyere aka n'ihe gbasara ahụisiike.
O nweghị etu ọbụla ị ga-esi sie agwa ka ọ hapụ ịtọwa ntị.
Ị ma na e nwereike ighe agwa eghe, ma ọ bụ kwọchaa ya ka ọ bụrụ flawa e jizi eme ihe dị iche iche.
Ngwa weta oche, nọrọ ọdụ ka-anyị zọpụ njem ka ị mara ihe agwa ji bụrụ sawam maka nri oriri.
Gịnị ka agwa na-enye n'ahụ?

Ebe foto si, FoodAce
Onye ọbụla na-eri agwa nke ọma na-agbatị ndụ ya. Nkea bụ maka na ihe agwa nwere ọtụtụ ihe dị n'ime ya na-edozi ahụ.
Ụfọdụ n'ime ihe ndịa na-edozi ahụ gunyere Kalori, purotin, abụba, Kọpa, zịnkị, potashium, Vịtamin B6 na ọtụtụ ihe ndị ọzo na-edozi ahụ.
Mana n'ụzọ ọga-adị mfe, lekwa etu agwa si edozi ahụ
Agwa na-enyere aka maka ọnye chọrọ ịta ahụ. Nkea bụ maka na onweghị oke abụba nke na-ebute ibu.
Nke abụọ bụ na agwa na-enyere aka maka mgbarị nrị maka na o nwere fịba.
Ọzọ bụkwa na ọ na-edozi obi maka na ọnweghị oke abụba nke mere na onye na-erikarị ya anaghị arịa ọrịa obi.
Lee ụzọ dị iche iche e si esi agwa
Agwa agwọrọ agwọ

Ebe foto si, Matsecooks
Agwa bụ nrị na-amasị ndị Igbo.Ụzọ esi eri agwa ndị mmadụ kachamara bụ agwa agwọrọ agwọ.
Enwere ike ịji ọtụtụ ihe ndị ọzọ rie agwa mana ọtụtụ n'ime nri ndịa na-ebido n'agwa agwọrọ agwọ.

Ebe foto si, Matsecooks
Ihe eji esi agwa agwọrọ agwọ

Ebe foto si, Matsecooks
- Iko beans anọ
- Ọkara mmanụ nri
- tomantọ anọ
- ose
- yabasị
- ịsha
- na nnu.
Etu e si esi ya
- Saa agwa tinye ya na ite ị tinyere iko mmiri anọ
- Sie ya ihe dịka nkeji iri anọ
- Dịka agwa na-asụ, gwọọ ịsha, ayo na ose gị
- Mgbe agwụ derela, tinye ịsha,ayo, ose na mmanụ
- Tinye nnụ etụ ị si chọọ ma hapụ ya ka ọ sụkota ọnụ n'ime nkeji iri.
- Gbanyụọ ọkụ ma chere nkeji ise tupu ị kuputa ya.
Akara

Ebe foto si, Mastecooks
A si na nwata na-ata akara na-ata ego ya. Echetara m mgbe mmadu bụ nwata ọ na-abụkari ụtụtụ ụbọchị sunde ka a na-enye anyị akara.
Akara na-akacha atọ ụtọ mgbe ọ di ọkụ ọkachasị mgbe ị ji achịcha ata ya nke ụfodụ ndị na-akpọ 'Burger' ndị be anyị .

Ebe foto si, Matsecooks
Ufodu na eji kwa akamụ ma ọ bụ garị erị akara.
Mana kedu etu e si esi akara?
- Nke mbụ bụ na ị ga-etinye agwa gị na mmiri n'ihe dịka nkeji iri atọ ka mmiri banye n'ime ya
- I ga-ewepụ azụ agwa dịka ị na asa ya mmiri.
- Mgbe ị mechara, ị tụgharịa ya nke ọma ka ọ rọo arọ.
- Tinye zia ose na ayo, nnụ na ihe eji enye nri ụtọ
- Mana echefu kwana ịsịnye mmanụ gị n'ọkụ.
- Were ngaji kunye agwa ị kwọro akwọ n'ime mmanụ ọku a
- Tugharịa ya n'obere oge ka ọ yee nke ọma.
Maị Maị

Ebe foto si, Foodace
Hewu! Nke a na-atọba n'ụmị.
Maị maị bụ nri mmadụ nwere ike iri mgbe ọbụla nakwa ebe ọbụla.
Ị nwere ike iji ihe gunyere akwụkwọ nri, komkom igwe, komkom mmiri ara ehi, 'Foil' were kechie ya.
Ụfọdụ ndị dọkịta ahụike na-ekwu na akpa wakịrị wakịrị nke a na-akpọ 'Santana' adịghị mma iji kechie ya.
Ị chọrọzia ka Maị maị gị bụru oyoyo, i nwereike itinye ya azu ma ọ bụ akwa e siri esi.

Ebe foto si, FoodAce
Akamụ na garị na moimoi gbara ndụ, maka ị were ha rie moimoi ịghọta na ụtọ azu dị n'isi ya.
Ụfọdụ na-eji kwa achịcha eri moimoi mana otu ọbụla, moimoi na-atọ ụtọ pụru iche.
Etu e si esi Mọịmọị
- Tinye agwa n'ime mmiri hapụ ya otu awa
- saa ya ma wepụ azụ agwa
- kwọọ ya ma tinye ya mmiri ka ọ gbatụ obere mmiri
- tinye mmanu, ose, nnu, yabasị na ogiri bekee.

Ebe foto si, Mastecooks
- tee mmanụ n'ahụ komkom ị chọro iji sie ya
- wụnye agwa a akwọrọ akwọ na komkom ndịa.
- ị nwere ike itinye azụ ma ọ bụ akwa esiri esi na ya bu moimoi.
- Tupu ị sinye ya n'ọkụ, tinye osisi ma ọ bụ akwụkwọ nri n'ala ite maka ire ọkụ
- tinye mọịmoi na ite ma sikwasa ite n'ọkụ
- ọ na-ewekarị ihe dịka nkeji iri atọ ruo otu awa tupu o ghee
Agwa asụrụ asụ

Ebe foto si, Matsecooks
Agwa asụrụ asu kacha baa ụba na mpaghara owụwa anyanwụ Naijirịa.
Ọ na-abụ a sụ chaa agwa esiri esi ewere stụ a na akpo 'Ewa Agoyin' were rie ya.
Akụkọ ndị ga-amasị gị
Ihe nkiri a ga-amasị gị:









