Wilder vs Fury: Kedụ onye ga-akụpụ ibe ya ọkwụrụ n'anya n'etiti Wilder na Fury?

Deontay Wilder na Tyson Fury

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Deontay Wilder na Tyson Fury ga-ezute onwe ha ọzọ na Las Vegas taa.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Taa ka anyị ga-ama mbe abụọ nke bụ oke dịka Deontay Wilder na Tyson Fury ga-apịa ọkpọ na Las Vegas n'ogige mgbande ukwu WBC.

Nke a bụ ugboro abụo ha ga-ezute onwe ma cheta kwa na mgbe mbụ ha zutere onwe ha na onweghi onye meriri.

N'agbanyeghi na Wilder kuturu Fury na agba nke iri na abụo na asọmpị mbu ha kama Fury mere ihe tụrụ uwaniile n'anya dịka o biliri were lụwa kwa ya bụ ọgụ.

Nwaafọ Naijirịa na Mike Tyson na-ekwu na ọ bụ Tyson Fury ga-emerị kama ndị dịka Evander Holyfield, Larry Holmes na David Hayes na-ekwu na Wilder ga emerị fury.

Ọ bụ n'ọnụ ụtụtụ Sọnde na elekere anọ ka ya bụ ọkpọ ga-erute ihe onyonyo na mpaghara Afịrịka.

'Boko Haram na-akwụsị ụgbọala achọ ndị otu kraịst na ndị ọrụ gọomentị'

Boko Haram

Ebe foto si, Getty/AFP

Ndị otu Boko Haram awakpola obodo Garkida nke dị na okpuru ọchịchị Gombi dị na Adamawa steeti.

Ndị obodo Garkida gbara ọsọ kwuru na ndị boko Haram na ndị nchekwa na-alụ ọgụ mgbe ha sị obodo ha gbapụ n'ụbọchị fride.

Akụkọ yiri ibe bụ na onye njem gbara ọsọ ndụ n'ụzo jikọrọ Damatutu na Gashua kwuru na Boko Haram mechiri okporo ọzọ a na-acho ndị ofufe nke Kraist, ndị ọrụ goomentị na ndị nchekwa.

O kwukwara na ha jidere ndị otu nchekwa vigilante n'ụzo ahu ebe onyeisi ndị Vigilante kwetara na awakporo ụfọdụ ndị otu ha.

Nke a na-eme dịka onyeisia ndị agha Naijirịa bụ Yusuf Brutai na-ekwu na ọfọrọ abalị ole naole ka ndị gha Naijirịa merie ndị otu Boko Haram.

'Ndị ụlọomeiwu tinyekwaranụ Buhari anya n'ihe gbasara ego Abacha a'

Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Ndị otu pati PDP akpọkuola ndị ụlọomeiwu ka ha gbatara Naịjirịa ọsọ enyemaka.

Ha sị na ha chọrọ ka ndị ụlọomeiwu kwanye Onyeisiala Muhammadu Buhari ọkụ n'ike ịma ihe ọ chọrọ iji ego Abacha zuru nke ndị Amerịka welatara, mee.

Lee ihe ha dere na soshal midia:

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Coronavirus na Saụt Koriya

Onye na-aría óría coronavirus

Ebe foto si, AFP

Mba Saụt Koriya ekwuola na ọnụọgụgụ mmadụ ole bu ọrịa Coronavirus na mba ha mụbanyere karịa etu ọ dibu, n'ime naanị otu ụbọchị.

Kim Gang-Lip bụ osote minista na-ahụ maka ahụike na mba ahụ sị na ha achọpụtala mmadụ narị abụọ na itoolu bukwa ya tinyere mmadụ narị abụọ na anọ bubu ya.

Mba Saụt Sudan enwetela osote onyeisiala ọhụrụ

Riek Machar

Ebe foto si, Reuters

E duola Riek Machar bụbu onyendu ndị otu nnupuisi n'iyi ọrụ dịka osote onyeisiala mbụ nke mba Saụt Sudan.

Nke a bụ atụmatụ Onyeisiala Salva Kiir wepụtara iji kpee udo ha na-atụ anya ga-akwụsị agha mba ha lụwara kemgbe afọ isii gburula ihe ruru mmadụ puku narị anọ.

Lampard akuzierela Mourinho na 20 bụ ọgụ

Mourinho na Lampard

Ebe foto si, Getty Images

Frank Lampard na-achịkọta Chelsea kuzirila Jose Mourinho na "Twenty bụ ọgụ" dịka Chelsea wefere obi azụ wee nyụọ Tottenham anya mgbe ha zutere taa.

Nkuzi a bịara dịka Chelsea ji goolu abụọ a satara otu jide azụ ụlọ ha ma merie Tottenham.

'O rubeghi oge a ga-agbape okeala Naịjiria'

Mohammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala Najirịa ekwuola na oge erubeghị mgbe a ga-agbape okeala Naijirịa ma rịọ mba ndị ha na Naijirịa nwere okeala ka ha nwee ndidi.

Ọ bụ mgbe onyeisiala Burkina Faso bụ Roch Marc Christian Kabore chọtara ya n'ụbọchị Fride n'ụlọ onyeisiala Naijirịa ka Buhari kwuru nke a.

O kwukwara na ọ bụ mgbe ngalaba ehiwere ime nyocha maka okeala Naijirịa wepụtara mpụta nyocha ha ka ọ ga-ama ma a ga agbape okeala Naijirịa.

Buharị siri na ihe kacha mkpa eji mechie okeala bụ makana ndị omekome sị ya ebubata ngwa agha na ọgwụ ike.

O kwukwara sị na kamgbe agbachiri okeala Naijirịa na mkpamkpa ndị omekome ebelatala ma sị kwa na ndị ọrụ ugbo na Naijirịa na-akọpụta osikapa na-agbazị aka ahịa.

Buharị gwara Kabore na uche ya dị na ihe Burkina Faso na-agabiga maka ịgbachị okeala Naijirịa ma sị ya na ọ na-eme ihe niile onwere ike ime iji hụ na agbapere okeala.

Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ndị IMN na Gọọmentị Kaduna steeti

Ndị otu IMN na-eme ngagharị

Ebe foto si, Twitter/@SZakzakyOffice

Nkọwa foto, Ndị otu IMN na-eme ngagharị

Gọọmentị Kaduna Steeti ekuola na ha ga-aga ụlọikpe mkpegharị maka mkpebi ikpe ụlọikpe ukwu banyere ndị otu akpọrọ Islamic Movement of Nigeria atọghapụrụ ụbọchị Fraịde.

Gọọmentị Kaduna sị na mkpebi ụlọikpe a tụrụ ha n'anya dịka ha sị na ndị a atọghapụrụ wakporo ndị agha n'ezie n'afọ 2015.

N'ofesi

Bernie Sanders

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, A na-atụanya na Bernie Sanders ga-anọchite ndị otu Democrats na ntụliaka onyeisiala Amerịka

Bernie Sanders bụ onye sepụtere isi karịcha ụgbua n'ime ndị na-achọ ohere iji ọkọlọtọ pati Democrats zụọ ntụlịaka onyeisiala Amerịka agwala ndị mba Rụshịa ka ha Wepụ aka na ndọrọndọrọ ọchịchị ha

Nke a na-abịa dịka ndị ọrụ nyocha na Amerịka gbara ama na Rushịa na-akpa nkata ịhụ na Donald Trump meriri.