Nigeria Border Closure: Ihe gọọmentị sị a ga-eme tupu ha agbapee 'border'

Seme Bọda

Gọọmentị Naịjirịa n'abalị anọ nke ọnwa Nọvemba nyere ọnọdụ ihe ndị a ga-eme tupu ha agbapee okeala ha na mba ndị ọzọ bụ nke ha gbachiri kamgbe ọnwa Ọgọst.

Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ bụ Geoffrey Onyeama na ndị komitii na-ahụ maka mgbachi okeala kwupụtara nke a n'Abuja.

Aha onyonyo, Nigerian Border Closure: 'Anyị ahụghị ngwaahịa zụta maka mmechi 'Border''

Ọnọdụ ndị a bụ nke mịnịsta Onyeama gụpụtara gụnyere:

  • Ngwaahịa ọbụla si mba na-esoghi n'ECOWAS na-abata Naịjirịa ga-anọ n'ime ngwugwu mbụ e ji mara ya. A ga-eburu ya site n'odụ ụgbọ mmiri ruo n'ebe okeala nke Naịjirịa.
  • Ngwaahịa ọbụla ndị mba so n'ECOWAS rụrụ ga-emezu iwu na-achị nrụpụta ngwaahịa ndị ECOWAS ka aka ghara ịkwa ya. A ga na-arụpụta ọtụtụ ngwaahịa na mba ndị so n'ECOWAS. A ga-etinye ego ruru pasentị iri atọ n'elu ngwaahịa ọbụla si mba ndị ọzọ abata n'ECOWAS.
  • A ga-ekpochapụ ụlọ ngwaahịa ọbụla dị n'agbata okeala Naịjirịa na mba ndị ọzọ.
  • A ga-eke ngwaahịa niile a na-ebubata na Naịjirịa n'ime ngwugwu nke ya.
  • A bịa n'ime njem n'okela Naịjirịa, ndị njem ga-enye akwụkwọ ikike a ma ama dịka akwụkwọ ejirimara mba onye.

N'ime izuụka abụọ na-abịa abịa, gọọmentị Naịjirịa na mba ndị agbataobi ya dịka Nijee na Benin ga-enwe nzukọ ilebanye n'iwu ndị a.

Ndị isi ụlọọrụ na-ahụ maka njem, mịnịstrị na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ, na ndị ọrụ nchekwa ga-eso na nzukọ a.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amsị gị: