Aba Women's riot: Gịnị ka ị ma mere n'oge a n'afọ 90 gara aga?

Ebe foto si, Getty Images
Ị ma ihe mere ụmụnwaanyị Aba ji gbara ọtọ were mee ngagharịiwe wuru ewu n'afọ 1929?
Ngagharịiwe a wuru ewu n'akụkụ ụwa niile n'oge ahụ n'ihi na atụwaghị anya na ụmụnwaanyị nwere nkwuwa okwu n'ala Igbo.
Gịnị kpatara 'Aba Women Riot'?

Ebe foto si, Getty Images
N'afọ 1928, ndị ọcha mba Ịngland na-achị Naịjirịa malitere ịnakọ ụmụnwoke ụtụisi.
Ha na-ezipu ndị mmadụ ka ha kpagharịa n'ụlọ n'ụlọ gụkọọ ụmụnwoke.
Mana n'afọ 1929, ndị ọchịchị nyere iwu na ụmụnwaanyị nakwa anụ ụlọ ga-eso n'ihe a na-agụkọ iji gbakọọ ụtụisi.
Nke a ekweghị ụmụnwanyị odidi chaa chaa n'ihi na ihe siri ike oge ahụ; ha wee foro ntutu taa, gbakọọ ọnụ wee malite ngagharịiwe.
Kedụ ndị so mee ya bụ ngagharịiwe?

Ebe foto si, Ynaija.com
Otu n'ime ndịisi ụmụnwaanyị ahụ so hazie 'Aba Women Riot' bụ nwaanyị a kpọrọ Nwanyeruwa.
Dịka akụkọ si kwuo, Nwanyeruwa wụ onye Ngwa mana ebe a lụrụ ya wụ n'Oloko.
Ndị ọzọ bụ Ikonnia, Nwannedia na Nwugo.
Onye nke ọzọ bụ Mary Okezie nke a sị bụ nwaanyị Ngwa mbụ gụrụ akwụkwọ.
Okezie esoghị mee ngagharịiwe ahụ mana ọ bụ ya dere akwụkwọ degara otu e hibere ka ha nyochaa ihe kpatara ya bụ ngagharịiwe.
Ngagharịiwe a rukwara obodo dịka Ikot-Abasi nke dị n'Akwa Ibom Steeti.
Ngagharịiwe ahụ ọ mịtara mkpụrụ?
Ọ bụ eziokwu na ihe karịrị ụmụnwaanyị iri ise nwụrụ na ya bụ ngagharịiwe ka ndị uweojii bịara jiri egbe chụsasịa ha ma gbaa ha egbe, mana ọ mịtara mkpụrụ.
O mere ka ndị ọcha na-achị oge ahụ mata na ụmụnwaanyị abụghị ofe nkupu.
Ngagharịiwe ahụ mekwara ka otu ụmụnwaanyị siwanye ike na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa niile.
'Aba Women Riot' 2019

Ebe foto si, Nwachukwu Chukwu
N'ọnwa Ọktoba afọ 2019, ọtụtụ ụmụnwaanyị mere ngagharịiwe n'Aba.
Iwe ha bụ maka ajọ ụzọ na enweghị ọrụ nke juputara na steeti Abịa.
Ha kwuru na ha chọrọ ime ihe ụmụnwaanyị Aba mere na 1929.
Mana otu ụmụnwaanyị ọzọ pụtara mekwaa ngagharịiwe n'otu ụbọchị ahụ na-ekwu na ọchịchị Gọvanọ Okezie Ikpeazu dị ha mma n'ahụ.
Gọọmentị Abịa kwukwara na ọ bụ ngobi ka e gobiri ụmụnwaanyị ahụ mere ngagharịiwe nke mbụ ahụ.

Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:











