'A wakpoola ụlọahịa m n'Aba'

Ebe foto si, Jane Ogbuata
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Jane Ogbuata bụ onyeisi otu ụmụnwanyị a kpọrọ 'Women for Change Initiative', bụ ndị mere ngagharịiwe n'ụbọchị Mọnde, agwala BBC Igbo na awakporo ụlọakụ ya n'Aba n'ehihie Tọzde.
O buruụzọ gwa BBC Igbo na ndị otu ndọrọndọrọ PDP nakwa ndị gọọmentị Abia steeti na-eyizi ya egwu nke ukwu.
Ọ gwara BBC Igbo na nke a malitere kamgbe ha mechara ngagharịiwe ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
O kwuru sị "Kamgbe abalị abụo gara aga, ehibeghị m n'ụlo m."
"E nwere ndị ji ụgboala ojii bia nọrọ n'ihu ọdụahia m n'Ikotekpene road, Ogbor hill, Aba."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Nke a na-abịa dịka Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi Abia steeti bụ John Okiyi kwuru na a kwụru ụmunwaanyị ndi ahụ mere ngagharịiwe ụgwọ.
Mana Jane Ogbuata kwuru na ọnweghi onye kwụru ha ụgwọ ma ncha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
O kwukwara na onweghị otu ọbụla ha na ha na-arụkọ
"Ihe kacha kpalie mmụọ m bụ mgbe onye otu anyi bi na Ngwa Road ime na-eme, mana maka ụzo ọjọọ, nwaanyị ahụ nwụru tupu a kpọga ya ụlọ ọgwụ."

Ebe foto si, Nwachukwu Chukwu
Ogbuata kwuru na "Gọọmentị rụo ụzo, ụmunwaanyi ahu ụzo gaa ahia, ụmụ anyị a gaa akwụkwọ, ndị mmadụ enwee ike bata Aba zụo ahia."
O kọwara na ọ bụ ikike ha n'ọchichi onyekwuoucheya ime ngagharị iwe.
Jane Ogbuata kwuru na ha anaghi ezo onwe ha ezo.
O kwuru na aha otu ha bụ 'Women for change initiative and Equity Organisation' na ha na-enwe nzụkọ ha na 'CS park'.
Ọgbuata kowara na ha nwere uwe ha na-eyi dịka otu, kama mmadụ niile bụ ndị otu ha na-aga ahia azuta nke ya.

Ebe foto si, @PDP Twitter
Gịnị ka PDP kwuru?
Mgbe BBC kpọtụụrụ onyeisi ndị PDP n'Ukwa East bụ Okechi Nwohu onye kwuru na ebubo na ndị PDP na eyi Jane Ogbuata bụ asi.
O kwuru na ọchịchị Gọvanọ Okezie Ikpeazu agaghi eme ihe dị etu ahụ.
Abia steeti abụghị ọchịchị tigbuo zọgbuo nweghi
Kọmishọna mgbasa ozi bụ John Okiyi ekwuokwala na 'Gọmenti Abia enweghi efe ịchụgharị onye ọbụla'.
Ọ zị na Gọvanọ Okezie Ikpeazu enweghi efe tigbuo zọgbuo."Ndị ahụ bụ ndị azụrụ azụ" -John Okiyi, Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Abia steeti kwuru
Mana kọmishọna mgbasa ozi bụ John Okiyi gwara BBC Igbo na ụmụnwanyị ruru otu narị ndị mere ngagharịiwe bụ ụmunwaanyị ndị otu ọzọ kwụrụ ụgwọ ka ha mee ngagharịiwe megide Gọvanọ Ikpeazu.
Mazi John Okiyi kwuru na ọ bụ otu nwaanyị ọ kpọro 'Madam Jane' bidoro n'ịzụụka atọ gaara aga acho ụmunwanyi ọ ga akwụ ụgwọ ka ha soro ya mee ngagharịiwe.
O kwukwara na ọ ma ndị ha na madam Jane soro kpaa nkata a.
Okeiyi kwuru maka ihe onyonyo gosiri ebe ụmụnwanyị a na-anara ego n'ihu ụlọ 'Madam Jane'.
Kama mgbe BBC lere ya bụ ihe onyonyo, e gosighi ebe ụmụnwaanyị a na-anara ego.
Ihe onyonyo ahụ gosiri ebe ha na-edebanye aha ha n'akwụkwọ.
Mazị okiyi kwukwara na ụmụnwanyi ọzo ndị ruru narị atọ hụru nkata ọjọọ ndịa mere ngagharịiwe kpara wee pụta mee ngagharịiwe nke imegide ihe Mazi okiyi kpọrọ nkata imegide gọomentị gọvanọ Abia seeti.
Maka iji ụgwọ
Mazi John Okeiyi kwuru na onweghi onye na-arụrụ gọọmentị Abia steeti ọrụ e ji ụgwọ.
O kwukwara na ọ bụghị gọọmentị Abia steeti ka ọ dịrị ịkwụ ndị Abia steeti Politeknịk (AbiaPoly) na ndị ụlọọgwu mmụta nke Mahadụm Abia steeti ụgwọ (ABSTH).









