Dave Umahi: 'Onye nọchiri ụgbọala m ụzọ ga-anata ntaramahụhụ'

Ebe foto si, Dave Umahi
Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi ekwuola na ndị nchekwa ya nwere ikike igba onye ọbụla nọchiri ụgbọ ala ya n'okporo ụzọ egbe.
O kwuputara nke a mgbe ya na ndị ụlọọrụ gọọmentị Ebonyi steeti nwere nzụkọ n'Abakiliki n'ụbọchị satụde.

Ebe foto si, EBONYI GOVERNMENT
Umahi jiri ohere a were kọwara ndị a etu ndị mmadụ siri gbochie ụgbọala ya igafe n'okporo ụzọ dị n'Ọnịcha.
O kwuru sị na na-agbanyeghị ndị nchekwa ma ndị agha ha na ya so, ndị a achọghị ka ha gafee.
Nke a mere ka Gọvanọ Umahi nye ndị nchekwa ya iwu ka ha nwuchie ndị niile nọchiri ya ụzọ.

Ebe foto si, Getty Images
O kwuru na ọtụtụ na ime ndị a gbara ọsọ ma na ọ dị kwa otu onye agha ha napụrụ egbe ya.
Umahi kwuru na ndị nchekwa na ndị uweojii pụrụ iche na-agba mbo inwude ndị a niile.
O kwukwara na mgbe a nwụdoro ha, na a ga-akpọta ha n'Ebonyi steeti ma tụo ha nga.
Ọ bụ nke a mere ka Umahi si " imu anya abalị maka ikwa ozu ga akwụsị n' elekere iri nke abalị site ụgbụa gawa n'ihu".
Gọvanọ Umahi kwukwara na mgbe ọzọ, ndị nchekwa ya pụrụiche nwere ikike igba onye ọbụla nọchịri ya ụzọ egbe n'ihi na iwu naijirịa kwadoro ya.
O kwuru na-onye ga-anọfe elekere iri ga-enweta ikike sitere n'aka onyeisi okpouru ọchịchị ya kama ihe ọbụla mere ga-adị onye enyere ikike a n'isi.
Ọ ga kwara n'ihu kwuo sị " A chọrọ m ka agbasaa ozi a nke ọma maka na nsogbu m abụghị maka onwe m, kama ọ bụ onye nkiti na-agara onwe ya ndị a nwere ike iwakpo".










