Big Brother Naija: Kedu ihe ndị meriri 'Big Brother' mbụ ji ndu ha eme ụgbu a.

Ebe foto si, efemoney/Instagram
Dịka Mercy Eke (Lambo) ritere ihe ruru nde naira iri na isii n'emume Big Brother Naija nke 2019, anyi nyochara ndị ritere ụrụ na mmerị Big Brother na mbụ etu ha si eme ugbua.
Ihe emume Big Brother Naija bụ ihe na-amasị ndi Naijiria ma ndị ntoroọbịa ma ndị okenye.
O bidoro n'afọ 2006 na Naijirịa ma bụru kwa emume na-ewu ewu mgbe ọbụla emere ya.
Gụo akụkọ a ka ị mata mbọ ụfọdụ ha na-agba ugbua.
Efe Ejeba

Ebe foto si, Efe Ejeba/Instagram
Efe Ejeba onye eji 'Based on Logistics" mara meriri emume BBNaija nke 2017. Efe bụ onye Delta steeti ma bụrụkwa otiegwu.
N'agbanyeghị na o nwere asambodo 'Economics', ọ bụ iti egwu masịrị ya.
Kemgbe ọ pụtara n'ụlo 'Big Brother', Efe na-enyere aka n'ihe gbasara agụmakwụkwọ ọkachasị na Jọs ebe o nyere ụmụakwụkwọ oche na ihe ndị ọzọ.

Ebe foto si, Efe Ejeba
O tipụtala egwu dị iche iche ma nke ọhụru ya na Ice prince tiri na nso nso a.
Ejeba ka na-arụkwa ọrụ onye obi ọma ma o tinyekwara ego ya dịka onye ojiegoachụego n'ihe dịka Teknụzụ, Agụmakwụkwọ na Ime njem, ma na-agbape ebe esi enweta mmiri (Bore Hole) n'ebe dị iche iche.
Miracle Ikechukwu Igbokwe

Ebe foto si, miracleikechukwu/Instagram
Miracle bụ nwa afọ owerre Imo state bụ kwa onye ọkwọ ụgbọelu.
O meriri BBNaija (Double Wahala) n'afọ 2018.
Ihe o ritere bụ ego na ngwa rụrụ nde Naịra iri anọ na ise.
Miracle kwuru na ọ ga-alaghachị ọmụmụ ịbụ onye ọkwọ ụgbọelu.
Ka ọ dị ugbua, Igbokwe abụrụla nke ndị ọkwo ụgbọelu na-akpọ "Instrument Rated".
Katung Aduwak

Ebe foto si, katung_aduwak/Instagram
Katung Aduwak bụ onye mbụ meriri Big Brother Nigeria nke mbụ emere n'afọ 2006.
O ritere ihe ga-abụ nde naịra iri atọ na isi, na puku narị abụọ ma agbanwe ya n'ọnụ ego ugbua.
Aduwak gara mba Amerịka ebe ọ mụrụ etu esi ahazị ihe ejiji.
Ọ mechara lọta Naijirịa mgbe ọ gụchara were hazie ụfodụ ihe ejiji nke gụnyere 'Unwanted Guests' na 'Heavens Hell'.
Uti Nwachukwu

Ebe foto si, siruti/Instagram
Uti nwachukwu turu ugo na Big Brother Africa nke afọ 2010 nka akporo 'All Stars'.
O ritere ihe ga-abụ nde naịra iri asaa na abụọ na nari puku anọ ma agbanwe ya n'ọnu ego ugbua.
Nwachukwu bidoro ime ihe ejiji mgbe ọ mechara Big Brother Africa.
O bidoro ime ihe ejiji n'afọ 2011 ma tụrụ ugo n'ime ejiji n'emume 'Golden Icons Academy Movie Awards (GIAMA)' n'afọ 2012 dịka onye kacha eme ihe ejiji.
E mere emume a na mba Amerịka.
Karen Igho Rakos

Ebe foto si, karenighorakos/Instagram
Karen Igho Rakos bụ onye mbụ meriri 'Big Brother' dịka nwanyị Naịjirịa na kwa nwanyị mbụ n'Afrịka n'afọ 2011.
O ritere ihe ga-abụ nde naịra iri asaa na abụọ na nari puku anọ ma a gbanwee ya n'ọnụ ego ugbua.
O na-eme ihe ejiji nke gunyere 'Omo Ghetto', 'Keeping my man', 'Tinsel' na ndị ọzọ.
Kevin Chuwang Pam

Ebe foto si, Instagram/Kevin
Chuwang Pam bụ onye Naịjirịa mbụ meriri 'Big Brother Africa' mgbe o meriri nke a kpọrọ "Revolution" n'afọ 2009.
O ritere dọla puku narị abụọ ($200,000) dịka onye meriri, ma lụkwaa Elizabeth nwunye ya bụ onye ọ hụtara dịka ha abụọ nọ n'ime ụlọ Big Brother.
Ugbua, Kevin bụ ome ejije, o nwere ụlọọrụ na-ahụ maka ime obi aṅụrị, ọ bụ onye ọrụ ugbo, ọ bụ onye oji okwu eri ji (MC), ọ bụkwa onye ojiegoachụego nwekwara ụlọọrụ na-enyere ndị mmadụ aka n'efu.









