BB Naija 2019: E nyela Khafi ọsọ

Ebe foto si, Twitter/officialBBNaija
E nyela Khafi ọsọ n'egwuregwu Big Brother Naija.
Ọ bụ n'abalị Sọnde ka nke a mere.
Ezigbo aha Khafi bụ Kareem Ahmed.
Ọ gbara afọ iri abụọ na itoolu.

Ebe foto si, Instagram/acupofkhafi
Cheta na Khafi bụ onye uweojii na mba Ịngland.
Ọ hapụrụ ihu ọrụ ya dịka onye uweojii wee sonye n'emume 'Big Brother'.
Dịka ndị uweojii 'Scotland Yard' si kwuo, "Otu onye uweojii nke ngabala 'Transformation Command' dere akwụkwọ ka e nye ya ikike i so n'ihe nkịrị nke onyonyo, kama enyeghị ya ikike".
"Anyị ma na onye uweojii a so na ihe nkiri a ma ọ na-eme nke ahụ n'ike nke ya."
Ihe a ga-eji cheta Kaffy bụ na ọbụ ya ritere ụgbọala nke ụlọọrụ ụgbọala Innoson bupụtara maka egwuregwu 'Big Brother'.
O ritere ụgbọala ahụ ka ya emechara asọmpi a kpọrọ 'proudly Nigerian challenge' n'ọnwa Ọgọst.
Ka ọ dị ugbua, ọ fọla mmadụ iri n'egwuregwu 'Big Brother Naija'
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:










