Aba women: Ụmụnwaanyị Aba emeela ngagharịiwe maka ajọ ụzọ
Umunwaanyị Aba emeela ngagharịiwe

Ebe foto si, Nwachukwu Chukwu
Nke na-eme ugbua bụ na ụmụnwaanyị Aba abadola ngagharịwe maka ajọ ụzọ na enweghịọrụ ha sị na-emekpa ha ahụ.
Ụmụnwaanyị ndị a na-echetere ụwa na ọ bụ ha bụ ụmụnwaanyị Aba eji Aba women's riot nke 1926 mara na-akpọkụ Gọvanọ Okezie ikpeazụ ka ọ bịa tinye anya na mmepe Aba.
Ụmụnwaanyị a na-ebe akwa enweghị ọrụ, akwụghị ndị ọrụ ụkwọ ọnwa, enweghị ọkụ na-ajọ ụzọ.
Ụmụnwaanyị ahụ nke ọtụtụ n'ime ha bụ ndị ahịa sị na ha anaghị ahụ ụzọ ha sị aga imeobodo egote ahịa.

Mana Gọmmentị Abịa steeti na-ebo ebubo na ndị na-eme ngaghari iwe bụ ndị egotere egote.
N'aka ọzọ, otu ụmụnwaanyị ọzọ pụtara na-akwado Gọvanọ Ikpeazu.
Onyeisiala Buharị agụpụta usoro mkpata na mmefu nke 2020

Ebe foto si, Bashir Ahmad/Twitter
Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọpụtala ego ndị Tarị iri na ụma asaa bụ ego ọ na-ele anya imefu maka ọrụobodo ha ga-abado n'afọ 2020.
Buhari sị na-atụrụ anya na ego a ga-abata sịte n'ire mmanụ agbidi ruru otu nde na ụma iri asatọ na isii kwa ụbọchị na ọnụego dọla iri ise na asaa.
Ọ kwụkwara na ọ bụ na ụtụisi VAT ka ya bụ usoro tubedere isi bụ nke ha ga-eji bado ọrụ na mmepe agụmakwụkwọ, ahụike nakwa ihe ndị ọzọ eji enyere ndụ aka.
Onyeisiala sị na ha jiri gụpụta akwụkwọ mkpata na mefu akụ ngwangwa bụ ka enwere ike tinyere ya n'ọrụ malite na ọnwa mba afọ 2020.
Onye ọkammụta ndị Ghana agaala izuike

N'ofesi e Mahadum ndị Ghana agwala ndị ọka mmụta abụọ ahụ ihe nkiri BBC gbara n'anwụ ha nọdụgọdi n'ụsọ ka ewere nyọchacha ya bụ ajọ akwa ha kpara.
Ụlọakwụkwọ ahụ dere nke a na akwọkwọ ozi ha degara ndi nta akụkọ bụ ebe ha sị na Ransford Gyampo na ọkankuzi Paul Kwame Butakor ga-abịa ịza ajụjụ maka ebubo a.
Nwaanyị mụru nwa agbalahula Usain Bolt n'ọsọ

Ebe foto si, @AF85
N'egwuregwu e, nwaanyị mụrụ nwa ọnwa iri akuriela efere nrite Usain Bolt na ọsọ 4x400 mixed relay na World Atletic Championship na-akpọtụ na Doha ugbua.
Allyson Felix sị na ike a ya na-akpa bụ ihe ịtunanya dịrị ya n'onwe ya.
Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji
Aisha Buharị chọrọ ka ataa ndị meruru ụmụakwụkwọ ahụhụ

Ebe foto si, Aisha Buhari Facebook
Dịka akụkọ onye nkuzi mahadum ndị BBC gbara n'anwụ maka ịmetọ ụmụakwụkwọ na Mahadum Legos ka na-ewu, nwunye onyeisiala Aisha Buharị akatọọla agwa a dịka nke rere ure ma kwuo na ya ga-eme ihe niile onwere ike i ji hụ na ndị dị otua nwetere ntaramahụhụ ruru ha.
Okwuru na ụmụnwoke so kwa na ndị a na-emetọ ma kwụọ na ọ ga-anwa i ji hu na ndị niile emetọrọ ọtụa ga-enwe ohere ikwuputa okwu ma ndị metọrọ ha ga erite ntaramahụhụ ruru ha.
Ụgbọ kpuru ekpu

Ebe foto si, Getty Images
Akwa arịri na-ada dịka ụgbọ mmiri kpuru na Kirfi nke Bauchi steeti tara isi mmadụ iri atọ na asatọ .
Ọ bụ onyeisi ngalaba na-elekota obodo Kirfi bụ Alhaji Bappa, Abdu Bara Danmalikin gwara ndị ntaakụkọ nke a ma kwuo na mmadụ iri anọ banyere ụgbọ a mana nanị mmadụ abụọ ji isi ha pụta.
Mkpagbu ndị Uighur na China

Ebe foto si, Getty Images
Mba Amerịka amachiela ụlo ọrụ na ngalaba gọọmentị rụrụ iri abụo na asatọ na mba China maka mkpagbụ ndị otu alakụba bụ Uighur(Wiga) na mba ahụ.
Ihe mmachia pụtara bụ na tupu ngalaba ndị a azụọ ahia ọbụla n' Amerịka, gọọmentị etiti Amerịka ga-enyocha ma nye ha ikike izu ahia.
Syria

Ebe foto si, Getty Images
Donald Trump enyela iwu ka ndị agha Amerịka sịte na ogige syria na Mba Trurkey pụọ.
Otutu ndị omeiwu nke Amerịka katọro iwu a dịka ndị agha Turkey na agwado ibusa ndị otu Kurd bị na mpaghara ahu agha.
Ma cheta na ndị Kurd nyere Amerịka aka ilusa ndị otu oyi egwu ISIL ọgụ ma meria ha na mpaghara ahụ.
N'Egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Akụko ga-amasị gị
Lee ihe nkiri ga-amasị gị











