Aba fire disaster: Gọọmentị Abịa state ehibela kọmitii ga-etinye anya n'ọkụ gbara n'Aba

Ọkụ gbara Aba

Ebe foto si, Nelson Nwafor

Gọọmenti Abia Steeti ehibela kọmitii ga-enyoba anya n'ọkụ gbara n' Umuosi, Degema na Anaba street n'Aba, Abia steeti n'ụbọchi iri abụọ na asaa nke ọnwa September 2019.

Gọvanọ Okezie Ikpeazu enyela iwu ka kọmitii a tinye anya ma chọpụta ihe kpatara ya bụ ọkụ gbara ụlọ asatọ na ogbe ahụ.

Ha ga-achọpụtakwa egoole ụlọ na ngwongwo ndị mmadụ ọkụ gbara pụtara.

Kọmitii a ga-etinye anya na mmiri chọpụta ndị kpara ya bụ arụ ka e were kpụpụ ha ụlọikpe ma maa ha ikpe ka okwesiri.

Ọkụ gbara Aba

Ebe foto si, Nelson Nwafo

Dịka John Okeiyi bụ Komishona mgbasa ozi dị n'aka si depụta, ndị nọ na kọmitii a bụ:

1. Chief (Dr) Ukpai Agwu Ukpai (Onyeisi)

2. Mr Sopuruchi Ernest Beke (SOP) (Onye otu)

3. HRH Eze Sunday Emejiaka (Onye otu)

4. Dr NCNC Okoli (Onye otu)

5. Rev. (Dr) Ogboso Ejindu (Odeakwụkwọ)

Enyere kọmitii a izuụka abụọ ịme nchọpụta ndị a ma degara Gọvanọ akwụkwọ maka nke a.

N'aka ọzọ, otu na-ahụ maka mekọrịta ndị agha na ndị mmadụ bụ nke na-anọghị n'okpuru gọọmenti gara njem nleta na ebe ya bụ ọkụ mebiri ihe.

Nelson Nwafor

Ebe foto si, Nelson Nwafor

Nkọwa foto, Nelson Nwafor onyeisi ndị otu na ahụ maka mmekọrịta ndị agha na ndị nkiti

Dịka onye ndu ha bụ Comerade Nelson Nwafor si kwuo, "Ihe anyị huru ebe ahụ na-agba anya mmiri".

Nwafor sị na ndị otu ha gbara mmadụ iri na anọ ajụjọ ọnụ n'ebe ahụ.

Ha sị na onu mmadụ niile ahụ dakọrọ na-ịkagbụ agwa ndị uweojii bụ ndị ha na-ebo ebubo okụ ahụ.

Oku gbara Aba

Ebe foto si, Nelson Nwafor

Ndị uweojii agọkwaala ụkwụ na aka ebe ha hibekwara kọmitii nchọpụta nke ha.

Ndị otu a sịkwa na ogbe ahụ ka dịkwa ka ebe ọsọ gbara maka ndị uweojii na-abịa ebe ahụ akpara ndị mmadụ.

Lee ihe nkiri a

Aha onyonyo, 'Ọ bụ ndị Uweojii gbara gbara ụlọ anyị ọkụ'

Akụkọ ga-amasị gị