G20 Summit: Ihe mere ọgbakọ ndịisi mbaụwa a na-eme n'India jiri dị oke mkpa

Otu nwoke na-agafe njirimara nke ọgbakọ G20

Ebe foto si, Getty Images

Ndị isi ala, na ndị Praịm Minista si n'ụfọdụ mba ụwa ga-ezukọ maka nzụkọ kwa afọ nke G20 n'isi obodo mba India bụ Delhi site n'ụbọchi 9 rue 10 nke ọnwa Sepụtemba.

Ihe kachasị dị mkpa n'afọ a bụ mwụlite tọrọ atọ bụ 'sustainable development' na Bekee mana a na-atụ anya na agha dị na mba Yukren ga-eso n'ihe a na-akpa.

Gịnị bụ G20?

G20 maọbụ otu 20 bụ ọgbakọ ụfọdụ mba bụ ndị na-ezukọ ịkpa maka akụnaụba mba ụwa niile.

Na ngụkọ ha, pasentị 85 akụnaụba mba ụwa, pasentị 75 nrụpụta mba ụwa nakwa ụzọ abụọ n'ime ụzọ atọ ọnụọgụgụ ndị bi n'ụwa nọ n'otu ahụ.

Ndị so ha bụ ọgbakọ Yurop nakwa mba iri itoolu ndị ọzọ gunyere -Aregntina, Australia, Brazil, Canada, Chaina, France, Germany, India, Indonesia, Italy, Japan, Mexico, Russia, Saudi Arabia, South Africa, South Korea, Turkey, UK, USA. A na-akpọkarị mba Spain oku dịka onye ọbịa.

Obere otu n'ime otu G20 na-ezukọ dịka G7.

Ihe ndị ị kwesiri ma maka G20

Ebe foto si, Getty Images

Ụfọdụ mba n'ime G20 - Brazil, Russia, India, China na Saụt Afrịka ehibela otu dị iche bụ BRICS.

Otu a akwadola ịbu ibu dịka ha kpọrọ mba isii ndị ọzọ isonye ha na nzụkọ ikpeazụ ha gụnyere: Argentina, Egypt, Iran, Ethiopia, Saudi Arabia, nakwa UAE.

Kedụ ihe otu a na-akpa?

Ịhe ọgbako bụ G20 na akalị abawago na afọ ndị garaaga, site n’ịhe gbasara akụ na uba obodo ruo n’ịhe gbasara ọnodụ eligwe, ọku ga anogide, ịleghara anya n’ugbo nke mba ofesi na ịgba mba ndi ọzo ugbo.

Afọ afụrụ obula, onye ịsi ọhuru na enwere ọchịchị na ọtu G20 ma wepụta ụsọrọ ọhuru aga eji mee mgbakọ nke afọ.

N'afọ 2022, mba Indonesia nwere ọchịchị ọtu G20, nke mere ejiri mee ọgbakọ ndị ịsi ọchịchị na Bali.

Praịm Minista mba India Narendra Modi ebe ọ na-ezi minista ndị G20 ozi n'ụbọchị 2 nke ọnwa Maachị afọ 2023.

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Praịm Minista mba India Narendra Modi ga-ehibe nzụkọ afọ a na Delhi

Dika ndi ji ọchịchị afọ 2023,India choro ka ọgbakọ nke aga -eme na Delhi tinye anya na ịhe gbasara mmepe na-adigide nya na usoro agaeji welite uto akụ nauba nke dina etiti mba ndi mepere-emepe nakwa mba ndi ka na amalite mmepe.

Ọgbakọ a ga enye mba di ịche-ịche onhere ewe mkalịtaụka na ọtu na ọtu ma nyere kwa aka na ịhe di mparịtaụka n’igwe na etiti mba di iche-iche.

Ụlọ ọchichi nke ana akpo ‘’white house’’ kwuru na onyeịsiala bu Joe Biden ga enwe mparitaụka na etiti ndi ịsị, ni ihe bayere otu ga-esi lekọta ọnọdu enigwe, agha di na Russia nakwa otu aga esi kpokọta ọtu mba di ka ụlọ akụ uwa ka ha nyere aka luo ọgụ ma merie ubiam.

Na otuaka ahu, Kremlin kwuru na onyeịsịala mba Rusia Vladimir Putin agaghị abia yabụ ọgbakọ,dika akụkọ siri kwo, onyesịala China Xi Jinping agahi abịa na ọgbakọ ahụ.

E nwere okwu tara akpụ dịịrị mba ndị G20 ịkpa?

Na ajuju, enwere ịhe ndi na doghi anya gbayere mba ndi nọ na okpụrụ G20?

Ana enyo na agha Russia busara Ukraine nwere ịke ịbute ogbaahiara na ọgbakọ Delhi nke ana atụ anya imalite na oge na adighi anya.

Na owa Machị afọ 2022, ndi mịnịsta G20 nke mba ofesi, abiakwuro na mmpebi na ọgbakọ ha nwere ni-ihi nghọtahe kpọroọku di na etiti ndi nochiri anya US na Russia.

Na Ọgbakọ ndi ịsị Bali nke emere na Novemba na afọ 2022,nkata ha gbadoro ụkwụ na ịhe gbasara ngbongbo agha nke akpọrọ missiles nke sitere na agha daara na nkewa poland na Ukraine.

Minista mba Rọshịa bụ Sergey Lavrov n'ọgbakọ ndị Minista G20 n'ọnwa Maachị 2023
Nkọwa foto, Minista mba Rọshịa bụ Sergey Lavrov ga-anọchite anya Onyeisiala Putin n'ọgbakọ G20 nke afọ a

Maazị Lavrov bu onye nochịrịanya Putin na ọgbakọ Bricks nke emere na South Africa,na agbanyere na onyesịala hibere nya bụ ọgbakọ site na enyemaka ịhe oyonyo(video link)

Na owa Mee, China na Saudi Arabia abịaghị nzụkọ e mere maka nleghariaya na mba India, nke Kashmir hiwere maka na o nwere akụkụ Kashmir nke mba Pakistan na-azọ.

Okwu eseela n'etiti India na China n'ihi ọzụzọ oke ala dịrị ogologo oge dịka Beijing wepụtara eserese gosiri na ebe a kpọrọ Arunachal Pradesh nakwa Aksai Chin dabara n'oke ala mba China.

Kedụ ihe mere e ji nwee 'foto ezinaụlọ'?

Na ngwụcha nzụkọ ndị dị mkpa, ndị isi ọchịchị ala na-esekarị foto otu ha a na-akpọ 'foto ezinaụlọ'.

Mana nkewa foto ahụ na-egosikarị bụkwa akụkọ nke ua dị iche.

N'afọ 2018, dịka egbuchara onye ntaakụkọ Jamala Khashoggi n'ụlọ nnọchiteanya mba Saudi Arabia dị na Istanbul, e mere Ọkparaeze Mohammed Bin Salman ka ọ kwụrụ n'akụkụ ma gbachikwa ya nkịtị.

Ọkparaeze Saudi Mohammed bin Salman nepụrụ anya dịka ndịisi ala na-abịakọta ise foto n'ọgbakọ G20 na Buenos Aires

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ọkparaeze Saudi Mohammed bin Salman bụ nke akpachapụrụ n'ọgbakọ 2018 dịka egbuchara onye ntaakụkọ Jamal Khashoggi

Kedụ uru G20 barala rue ugbua?

Na nzụkọ otu a nke afọ 2008 nakwa 2009, mgbe e nwere ọgbaghara metụtara ego, ndị isi ala kwekọrịtara ọtutụ atụmatụ ga-eme ka nsogbua a belata.

Mana ụfọdụ ndị ọgbakọ a edoghi anyakwuru na nzụkọ ndị ọzọ emere n'afọ ndị ọzọ ababeghi uru ọzọ n'ihi esemokwu na-adịkarị n'etiti ụfodụ mba dị ukwu.

N'agbanyeghị nke a, nzụkọ mba na mba na-aga ihu n'ọgbakọ a na-abakarị uru.

Iji ma atụ n'afọ 2019 na nzụkọ mere n'Osaka, aka na-achị mba Amerịka mgbe ahụ bụ Donald Trump na onyeisiala mba China bụ Xi Jinping kwekọrịtara ịmalitekwa okwu iji kpebie maka esemokwu azụmahịa dị n'etiti ha abụọ.

Nzụkọ G20 a na-ebute ngagharịiwe?

Ngagharịiwe buru ibu na-adanyekarị na nzụkọ ndị isiala a.

Ndị ekwenyeghi na capitalism pụtara gosi iwe ha na nzụkọ 2010 na Toronota nakwa nke Hamburg na 2017.

Onye ngagharịiwe kpu ugbege anya tụrụ ndị uweojii okwute n'ụbọchị 7 Julaị afọ 2017 na Hambụrg ugwu Jamani

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị nzogbu nzogbu na ndị uweoji kwatara ya n'afọ 2017 mgbe a na-eme nzụkọ nke afọ ahụ

Puku kwuru puku mmadụ gagharịrị n'iwe igosi iwe ha n'afọ 2018 maka ụfọdụ atụmatụ akụnaụba nke ndị G20 wepụtara.

N'afọ 2009 Ian Tomlinson na-ere akwụkwọ ntaakụkọ nwụrụ dịka ọ danyere n'ọgbaghara so ngagharịiwe pụta