Deontay Wilder akụpụtala kpakpando n'anya Breazeale

Ebe foto si, ANTHONY GEATHERS
Deontay Wilder kụrụ Dominic Breazeale ihe tinka kụrụ pan n'agba nke mbụ n'ọkpọ ha kụrụ ma maburu iko WBC World heavyweight na New York.
Wilder ji ọkpọ surie ogbo ya nke Amerịka n'ime agba nke mbụ, nke nyere ya mmeri iri anọ na otu na otu nhatanha n'ime asọmpi ọkpọ iri anọ na abụọ ọ kụrụla.
Aka esichaghị Breazeale ike na mbido ọkpọ ahụ dịka Wilder kpagidere n'akụkọ ụdọ ma na-esu ya ọkpọ dịka ebe a na-asụ ede.
N'ikpeazụ Wilder meriri n'ọkpọ ahụ dịka ọ ji otu ọnụ ọkpọ kunye Breazeale anya ajụ n'isi.

Ebe foto si, Getty Images
Dịka asọmpi ọkpọ a gụchara, Wilder kwuru "Onweghi ụzọ ga-egbochi m" ịkụso ndị ọkachasị na Briten bụ Tyson Fury na Anthony Joshua ọkpọ, O kwuru "na ha nọ na mkparịtaụka".
Nke a bụ ugboro iri anọ Wilder na-eji ịkụnye ndị mmadụ isi aba okpu merie n'asọmpi ọkpọ, ebe ọ bụ ọdịda nke abụọ Breazeale na-enweta.







