Atiku Abubakar sị Lauretta Onochie rịọ ya arịrịọ maka imetọ aha ya

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ dị mkpa

Rịọ m mgbahara - Atiku gwara Lauretta

Atiku na Lauretta

Ebe foto si, Atiku/Lauretta/Facebook

Atiku Abubakar eyiela egwu na ọ ga akpọpụ Laureta Onochie bụ onye enyemaka onyeisial Buhari n'ụlọikpe maka ịkatọ aha ya nakwa ịgha ụgha megide ya.

Atiku site n'ọnụ ọkaiwu ya bụ Mike Ozekhome, o kwuru na Onochie sị na aha ya dị n'akwụkwọ ojii nke mba UAE, na Atiku gara mba ahụ ịzụ ngwa agha o ji akwado ndị na-eyi ndụ egwu.

N'ime akwụkọ nke ọkaiwu Atiku zigara Onochie, ọ gwara ya ka ọ rịọ mgbahara ma kwụọ ego dị nde narị naịra ise ma ọ bụ chebiri ha n'ụlọikpe.

Egbuola onye UN bụ nwafọ Naịjirịa

Otu United nation ngalaba Mali

Ebe foto si, Getty Images

Otu United agbarụọla ihu n'ogbugbu egburu onye otu ha nwafọ Naịjirịa bụ onye ọrụ udo n'ime ọgbaghara dapụtara na Timbuktu dị na Mali.

Odeakwụkwọ ha bụ Antonio Guterres agwala gọọmentị Mali ka sie imi n'ala chọpụta ma taa ndị mere nke a ahụhụ.

Na mba Ijipt

Ụgbọala ndị njem nlereanya

Ebe foto si, Reuters

Ogbunigwe gbara n'akụkụ ụgbọala ndị njem nlereanya ma merụọ mmadụ iri na isii ahụ dịka na-agbafe Giza Pyramid dị na mba Egypt.

Akụkọ kwuru na ndị merụrụ ahụ karịchara na ndị si mba Saụt Afrịka, Agbanyeghi na onwebeghi ndị sị n'aka dị n'ogbunigwe a.

N'egwuregwu

Real Madrid

Ebe foto si, Getty Images

Real Madrid ewerela ịgba ọnyụpa mechie asọmpi La Liga ha nke afọ a dịka Real Betis ji ọkpụ abụọ bịawa ha azụ n'ụlọ ha.

Afọ a bụ otu n'ime afọ kachasị njọ nye Real Madrid dịka ha ji akara iri isii na asatọ gbaa ndị atọ.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo, Nollywood: 'Ihe nkiri Igbo ga-abụ egwu eji site na ntuziaka m na-eweta' - Ikeagwu

Ihe Iwuanyaneụ gwara Ipob

Olu Ụkọchukwu Peace

Okenye ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa bụ Emmanuel Iwuanyanwụ arịọla ndị otu Ipob na ndị ọzọ chọrọ inọrọ onwe ha ka ha chọọ ịdị n'otu Naịjirịa karịa ma ịkewapụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na aghazịgharịghị Naịjirịa na ọtụtụ agbụrụ ga ekewapụ n'ike nke ga-eme ka obodo bụrụ igwe.

N'akụkọ ọzọ,

Adeleke

Ebe foto si, ADELEKE TWITTER HANDLE

Onye zọrọ ọkwa gọvanọ n'Ọsụn steeti bụ Adeleke Ademola n'okpuru pati PDP na ntuliaka 2018 e mere na steeti ahụ edegarala ụlọikpe akwụkwọ mkpesa arịrịọ megidere mkpebi ụlọikpe nta.

Adeleke chọrọ ka ụlọikpe ukwu mee ka ụlọikpe nta (Appeal) soro mkpebi ụlọikpe ntuliaka kwuru na ọ bụ ya meriri ntụliaka gọvanọ 2018 na steeti ahụ.

Ihe Obasanjo kwuru maka nchekwa Naịjirịa ugbua

Obasanjo

" Ihe gbasara ikwụsị mkpamkpa Bokoharam na-akpa akarịala Naịjirịa ma karịkwa ndị ọchịchị West Africa."

Ọ bụ aka chiburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo na-ekwu nke a mgbe ọ gara mmemme Synod ndị Anglican na Delta steeti.

Obasanjo kwuru na ọ bụrụ na ebusoro otu Boko Haram agha mgbe ha ka malitechara nwakpo ha, ihe akarịghị imebi karịa etu ọdị ugbua.

N'egwuregwu,

Falcons

Ebe foto si, @thenff

Otu ụmụnwaanyị akpọrọ super falcons amabutela iko WAFU ka ha ndị otu egwuregwu bọọlụ Cote d'Ivoire chịpụchara ya n'agba ịkpeazụ.

Ha ji ọkpụ isi asatara ise site na penarịti wee meri Cote d'Ivore.

N'ofesi,

Arnold

Ebe foto si, AFP

Ihe onyonyo na-egosi ka esi wakpo onye na-eme ihe nkiri ama ama bụ Arnold Schwarzenegger ebe ọ nọ na-eme egwuregwu na mba South Africa na-efegharị n'elu soshal midia.

Mana Schwarzenegger ekwuola n'elu twitter na ọ dị sam maka o nweghị ihe ọjọ mere ya ma na-ekelekwa ndị mmadụ etu ha si gosi ihụnanya ha nwere n'ebe ọ nọ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo, Kidnapping in Nigeria: 'E gburu ndị atọrọ mụ na ha mana Chineke zọrọ m ndụ'