Tony Ubesie: Akatamkpo nwoke gbara mbọ maka nkwalite asụsụ Igbo

Ebe foto si, Twitter/@ogbonnaya_mark
Ọ bụrụ na Tony Uchenna Ubesie ka nọ ndụ, taa ka ọ gaara agba afọ iri asaa na abụọ.
Ma na-agbanyeghị na ya bụ nwa amadị e ji eje mba alaala mmụọ, ama ka na-agbakwa maka ike ọ kpara iji wulite asụsụ Igbo .
Onweghị nwa afọ Igbo ọbụla mụrụ asụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị na-agụghị ọbụladị otu n'ime akwụkwọ Ubesie dere.
Ubesie abụghị onye mbụ ji Igbo dee akwụkwọ akụkọ, mana aha ya kacha ada ụda ma a gụwa ndị odeakwụkwọ Igbo.
Onye bụ Tony Ubesie?

Ebe foto si, Twitter/@ogbonnaya_mark
Ubesie bụ onye obodo Achị nke dị n'okpuru ọchịchị Oji Riva nke Enugwu steeti.
A mụrụ Ubesie n'ụbọchị 22 nke ọnwa Febrụwarị afọ 1950 n'Enugwu.
Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Naịjirịa dị na Nsụkka ebe ọ mụrụ maka asụsụ bụ nke Bekee kpọrọ 'Linguistics'.
Akụkọ kwuru na Ubesie so na ndị agha Biafra oge a lụrụ agha.
Ka agha Bịafra bichara n'afọ 1970, Ubesie malitere ide akwụkwọ akụkọ iji kọwaa ihe dị icheiche ndị mmadụ gabigara n'oge agha.

Ebe foto si, Twitte/@ogbonnaya_mark
Ọtụtụ akwụkwọ o dere gbadoro ụkwụ n'agha Biafra.
Ubesie so na-agbụrụ nke abụọ ndị ji asụsụ Igbo dee akwụkwọ.
Agbụrụ nke mbụ bụ ndị dere akwụkwọ nke ha tupu alụọ agha.
Ha gụnyere Pita Nwanna (onye dere Omenụkọ), D.N Achara (onye dere Ala Bingo), Leopold Bell-Gam (dere Ije Odumodu Jere), na ndị ọzọ
Akwụkwọ Ụbesie dere

Ebe foto si, Twitter/@ogbonnaya_mark
Ọ bụ eziokwu na ihe e ji mara Ubesie bụ akwụkwọ akụkọ isii o dere, mana ọ bụghị naanị ha bụ akwụkwọ o dere.
Ubesie dere abụ itoolu n'ime akwụkwọ abụ a kpọrọ 'Akpa Uche'.
O nwekwara otu akwụkwọ ejije.
Akwụkwọ akụkọ ya gụnyere:
- Ụkwa ruo oge ya ọ daa (1973)
- Isi akwụ dara n'ala (1973)
- Mmiri ọkụ e ji egbu ibe (1974)
- Ụkpana okpoko buuru (1975)
- Ụkpaka mịịrị onye ụbịam (1975)
- Jụọ Obinna (1976)
- Okokporo (1988)
Ubesie bụkwa onye ntaakụkọ, onye nhazi ejije nke Bekee kpọrọ "theatre director" nakwa onye nkwalite ọdịnala.
Ọnwụ Ubesie

Ebe foto si, Twitter/@ogbonnaya_mark
Dịka e si depụta n'ọba ozi wikidata.org, Tony Ubesie nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ na Mmakụ dị n'Enugwu.
Ihe mberede a mere n'ụbọchị 11 nke ọnwa Febrụwarị afọ 1994.
Mana ndị Igbo na-atụ ilu sị, "Dimkpa taa akụ, a hụ ichere ya".
Ubesie gbalịrị ike ya ịkwalite asụsụ Igbo oge ọ dị ndụ, ye mere ude ya ka ji ede na-agbanyeghi na o meela afọ 26 ọ larala mmụọ.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka Ubesie
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ogbonnaya Mark bụ nwaokorobịa na-ede akwụkwọ Igbo kwuru na ọ bụ Ubesie kpalitere ya o ji malite inwe mmasị ịkwalite asụsụ Igbo.
Prince Ik Okolo gbakwara ama na Ubesie bụ dike e ji aga mba n'ịkwalite asụsụ Igbo.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@OnyeAjụjụ na @ikifediata kwuru na onye chọrọ ịmụta asụsụ Igbo, ya gụọ akwụkwọ Ubesie.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3

End of X post, 4

End of X post, 5