Nigerian Foods: Lee etu ị ga-esi sie 'plantain' ọ hapụ ite dọrọ n'afọ

Ebe foto si, Food Ace/Instagram
Gwam gwam gwam gwam nri i gaghị ejinwu ojoko nke ndị bekee na-akpọ Plantain were sie?
Ojoko dị a ka nwa agbọghọ mara mma a na-atụkwasara eze oge mgbe gboo.
OjokO na-enye ụmụ ihe na-enyemaka Bekee kpọrọ "Iron", "Vitamins", nakwa "fiber" n'ahụ.
E nwereike isi, ihụn, ịghe, ịgwọ maọbụ sekọ ojoko esekọ.
Lee ụzọ ole na ole ga-abụ isie Plantain ọ bụrụ ericha amịchaa aka.
1: Nke m ga-ebuzo bupute bụ ojoko ahụrụ ahụ

Ebe foto si, Food Ace/Instagram
Nke a bụ mgbado ume ụmụ mmadụ ji ejide onwe ha ma agụrụ na-anyụ ha anya.
A na-eji mmanụ nri na ụgba, ose na ogiri were esuru ya. Ụfọdụ na-ejikwa ofe tomanto eri ya.
Etu e si esi ya
- Gote ojoko chatụrụ acha
- Kpechasia azụ ya
- Hụnye ya n'ọkụ
- Na-akpagha ya ka ọ ghara ire ọkụ
- O ghee, ị kpachasịa ahụ ya
- Mepụta mmanụ Igbo were ya ripia ya.
2: Ojoko eghere eghe

Ebe foto si, Food Ace/Instagram
Ndị akpịrị ibem bịanu oo. Biko kedụ nri bụ eze ma a sị ka e chi eze maka nri e ji agba ụtụtụ.
I nwere ike iji akwa maọbụ akamụ were rie ya.
E jikwa ojoko eghere eri ọsikapa.
E jikwa ojoko eghere eghe eri beans makana ha abụọ bụ dị na nwunye na-ekweghị agbasa agbasa.
E ji ojoko eghere eghe agwọ anụ, nke ndị bekee gizdodo.
E jikwa ojoko eghere eghe eme kpekere nke bekee na-akpọ "Plantain chips".
3: Ojoko e ji akwụkwọ nri gwọọ

Ebe foto si, Food Ace/Instagram
Nwanne ọ bụrụ na ọbara maọbụ ike kọrọ gị n'ahụ, ndị dọkịta na-adụkarị ọdụ ka i rie ojoko eji akwụkwọ nri were gwọọ.
Ọ bụ ojoko na-achaghị acha ka e ji esi ya bụ nri.
Etu e si esi ya
- Bacha ojoko na-achaghị acha
- Bee ya kịrị kịrị ma sacha ya wunye n'ite.
- Gbanye mmiri na-agaghị agafe ogo unele ahụ rinne.
- Bee yabasi tinye na ya.
- Sụọ ịsha, ose na maggi tinye
- Tinye azụ ọkpọ maọbụ anụmanụ ọzọ na-amasị gị
- Ọ sụwa, ghewe were ngazi eji agwa gari wee tụgharịwa ya.
- Ọ rọkọọ etu isi chọọ, i fenye ya akwụkwọ nri.
- Fọtuo ya ozigbo.
Nri egheela ooo.
4. Ojoko esiri esi

Ebe foto si, Food Ace/Instagram
Onye ume na-adịghị ihụwa, ighe maọbụ igwọ, ga-esinwu ya etu ahụ ọ dị ma suo ya n'ofe ọbụla masiri ya.
5. Ojoko esere ka nri ji
Nke a ọ tụrụ gị n'anya? Ya atụkwala gị ma ncha. A na-akwọri ya ka aja ma sekọọ ya na akpụ were ya rie ofe gụrụ gị agụụ.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:










