Coronavirus: Adeboye kara ụka ya n'okpokoro ụlọụka Redeemed

Enoch Adeboye

Ebe foto si, Adeboye/Facebook

Ụkọchukwu Enoch Adeboye nke ụlọụka Redeemed Christian Cgurch of God (RCCG) kara ụka nke Sọnde ya n'ụlọ mmadụ elughi iri abụọ no n'ime ya dịka iwu gọọmentị Legọs siri kwuo.

Adeboye mere nke a n'agbanyeghị na ọ bụ ụlọuka ya adịghị na Legọs.

Atụmatụ a bụ dịka Naịjirịa nwetere mmadụ iri abụọ na asaa nwere nje coronavirus na Abuja, Legọs, Ekiti nakwa Oyo.

Ụtụtụ ụka, ọkachasị nke ndị Katọlịk na CMS mechiri emechi na Legọs n'ụtụtụ ụka dịka gọọmentị Legọs sị ka akwụsi ọgbakọ karịrị mmadụ 20 iji gbochie ikesa coronavirus.

Agbanyeghi na ụfọdụ ụka mepere na Legọs, ụka Sọnde adịghị etu ọ na-adibu ka ọtụtụ mmadụ noduru n'ụlọ ha.

N'ụka ndị mepekwaranu, ndị mmadụ na-ekwu na enyere ha ihe ha ga-ete n'aka iji gbochie ya bu nje.

A kara ụka n'ụka Reemed dị n'ụzọ e si aga Legọs mana ọ bụ so so mmadụ iri abụọ nọ na ya bụ ụlọ ụka na-abata ihe ruru mmadụ pụku ise.

Lee foto ụfọdụ ndị mmadụ wetere anyị banyere etu ụka siri dị n'ogbe ha.

Ụlọụka RCCG dị n'Ikoyi tinyere akwụkwọ na ụzọ ha iji gwa ndị mmadụ na ha agaghị aka ụka taa
Nkọwa foto, Ụlọụka RCCG dị n'Ikoyi tinyere akwụkwọ na ụzọ ha iji gwa ndị mmadụ na ha agaghị aka ụka taa
Ụlọ ụka Saint Vincent dị n'Olodi Apapa

Ebe foto si, Ejike KANIFE

Nkọwa foto, Ụlọ ụka Saint Vincent dị n'Olodi Apapa emepeghidi ma ncha
Ụlọ ụka Saint Flavius dị n'Oworonshoki
Nkọwa foto, Ụlọ ụka Saint Flavius dị n'Oworonshoki mepere mana ha mere nkwụcha nke Bekee kpọrọ "social Distancing"
Ụlọ ụka Saint Flavius dị n'Oworonshoki
Nkọwa foto, Ejikwa ihe nyụcha aka anabata ndị bịara ụka n'Ụlọ ụka Saint Flavius dị n'Oworonshoki
Ụlọ ụka Saint Mary dị n'Isolo ekweghịdị ka mmadụ banyere ma ya fọzịa ika ụka
Nkọwa foto, Ụlọ ụka Saint Mary dị n'Isolo ekweghịdị ka mmadụ banyere ma ya fọzịa ika ụka
Ụka Messiah dị n'Okota na Legọs tọgbọrọ chakoo
Nkọwa foto, Ụka Messiah dị n'Okota na Legọs tọgbọrọ chakoo