COVID-19: Ndị minista Nigeria enyela ọkara ụgwọọnwa ha maka agha coronavirus

Lai Mohammed

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ndị Minista iri anọ na atọ na Naịjirịa etinyela ọkara ụgwọọnwa ha maka ibuso coronavirus agha na mba ahụ.

Minista mgbasa ozi bụ Lai Mohammed kwuru na nke a bụ ụzọ ha ji akwado gọọmenti etiti n'agha ha na-ebuso ya bụ ọrịa ọjọọ a.

Gana

Afufo-Addo
Nkọwa foto, Onyeisiala mba Gana sị na Accra ga-eso n'ime obodo atọ ahụ ga-emechi

Minista mgbasa ozi bụ Lai Mohammed kwuru na nke a bụ ụzọ ha ji akwado gọọmenti etiti n'agha ha na-ebuso ya bụ ọrịa ọjọọ a.

A'Afrịka, aka na achị mba Gana bụ Akufo-Addo ekwuola na ọ bụ ụbọchị Monde ka ha ga-akpochi obodo atọ n'ime mba ahụ maka coronavirus.

Abịa chọrọ ịgbọchị ebe niile n'Eprelu

Okezie Ikpeazụ

Ebe foto si, Abia Government/Facebook

Nkọwa foto, Ikpeazu ekwaola na aga-emechi ngagharị niile n'Abia steeti

Gọọmentị Abịa steeti ekwuola na ha ga-akpọchi ebe niile na steeti ahụ malite n'abalị mbụ nke ọnwa Eprel afọ a.

Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Aba, Abia steeti
Nkọwa foto, Onye ọrụaka n'Aba
Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Nke a bụ nke bekee kpọrọ 'total lockdown' iji gbochie mfesa ọịa coronavirus na steeti ahụ.

Onyebuchi Ememanka bụ ọnụ na-ekwuru gọvanọ Okezie Ikpeazu kwuru nke a n'ụtụtụ Satọde

Ememanka kwuru na naanị ndị nwere ike ịkpọghe ụlọahịa ha bụ ndị na-ere ihe nri, na ihe ndị ọzọ dị mkpa n'ụlọ.

Steeti ndị ọzọ dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ nwekwara atụmatụ dị icheiche ha ji eche coronavirus aka mgba.

Ihe Enugu na-eme maka mmadụ abụọ buterela ọrịa coronavirus

Gọvanọ Enugu steeti

Ebe foto si, @GovUgwuanyi

Gọọmenti Enugu ekwuola na ha malitela ịchọta ndị niile ha na mmadụ abụọ buterela ọrịa coronavirus na steeti ahụ mekọrịtara n'ụzọ ọbụla.

E kwuru na mmadụ abụọ ahụ si mba Uk bata biara kpesa onwe ha dịka ndị nyocha e mere ha gosiri na ha bu ọrịa ahụ.

Ọ rịọrọ ka ndị ọzọ si mba ofesi ebe coronavirus na-akpa mkpa bata nso nso a ga kpesa onwe ha n'aka ngalaba ahụike nke Enugu steeti site n'ikpọ akara ekwenti ndị a 08182555550 maọbụ 09022333833.

N'Afịrịka,

Ụmụnwaanyị n'ọrụ

Ebe foto si, CONSOMED/AFP

Ndị ọrụ nọ na Tunisia na-arụpụta akwa eji ekpuchi ihu ruru puku iri ise kwa ụbọchị.

Ndị ọrụ a ruru otu narị na iri ise gụnyekarịrị ụmụnwaanyị ndị kwetere idopu onwe ha n'ụlọ ọrụ rue otu ọnwa mgbe ha ga-ahụkwa ndị bee ha anya ọzọ.

N'ofesi

Spain

Ebe foto si, EPA

Ọnụ ọgụ ndị nwụrụla na Spain maka ọrịa coronavirus ji iwe si n'ogo 832 banye 5,000 ka elekere iri abụọ na anọ gafechara.

Ebe mmadụ ruru puku iri asaa na ụma buterela ya bụ ọrịa.

Ha nọ n'ọdụ gbata gbata ruo ọnwa Aprelu iri na abụọ.

Ezipula ndị agha ka ha malite jiri kemikalụ na-egbu nje hịchasiwe ike ebe niile.

Ọkụ gbara ka ogbunigwe n'Akure ekewala ụzọ abụọ ma mebie ọtụtụ ụlọ

Akure

Ebe foto si, @RotimiAkeredolu

Gọvanọ Rotimi Akeredolu nke steeti Ondo kwuru na etu ọ dị ugbua na ya ndị ọrụ nchekwa na-agba mbọ ịmata ma ọ nwere ndị ihe mberede a metụtara.

Ọkụ ọgbụgba gbara n'Owo dị n'Akure ekewala okporoụzọ abụọ, mebie ụfọdụ ụlọ obibi , ụlọụka na ụlkọakwụkwọ dịketere ebe ihe a mere.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Akure bụ Tee-Leo Ikoro kwuru na ọ bụ otu ụlọọrụ na-arụpụta okwute bụ ngwongwo gbara ka ogbunigwe mgbe ha na-ebuga ya n'ụlọọrụ ha.

O kwuru na onweghị onye nwụrụ n'ihe mberede a mana ọkwọ ụgbọala bu ngwongwo ahụ merụrụ ezigbo ahụ ebe ebugarala ụlọọgwụ.

Akure

Ebe foto si, @RotimiAkeredolu

Lee ihe ndị soshal midia na-ekwu maka ọkụ ọgbugba a

@OndoFirstBorn setere onyonyo gosiri ka ndị mmadụ na-agbata ebe ihe a mere ma depụta na o mere ebe elekere otu nke ime abalị.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@meerah_moore kwuru na ụfọdụ mmadụ ebola ụda ahụ n'egbe eligwe, ụfọdụ kwuru na ọ bụ "Asteroid, ndị ọzọ sị na ọ bụ opi ike nke Akure dara.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Mmadụ 81 ebutela ọrịa Coronavirus na Naịjirịa

Ndị na-ekpuchi ihu ha iji gbochie coronavirus

Ebe foto si, Getty Images

Enwetela mmadu iri na otu ọzo bụ ọrịa Coronavirus na Naijirịa.

Ngalaba na-ahụ maka nje na ọrịa na Naijirịa bụ NCDC depụtere en'akara twitter ha na ọ bụzị mmadụ iri asatọ na otu bụzị ọrịa a na Naijirịa.

Mmadụ iri na otu a gụnyere asatọ si Legọs, abụọ si Enugu nakwa otu si Edo state.

Etu Chioma Davido si bute ọrịa Coronavirus

Davido na Chioma

Ebe foto si, @davidoofficial Instagram

Oti egwu David Adeleke nke eji Davido mara kwuru n'akara twitter ya, na nne nwa ya bụ Chioma ebutela coronavirus n'ime nyocha ndị otu ya ruru iri atọ na otu e mere.

Davido kọwara na ọ bu dịka o si njem Lọndọn lọta were mee nyocha ka ha chọpụtara na Chioma bụ ya bụ ọrịa.

O kwuru na-ahu siri Chioma ike dịka o dopuru onwe ya ma na-anata ọgwụgwọ.

Nwa ha nwoke ebughị ya bụ ọrịa.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

N'Afịrịka,

Okporoụzọ Zimbabwe

Ebe foto si, AFP

Onyeisiala Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa ekwuola na onweghị onye ga-apụ apụ cha cha bido n'ụbọchị mọnde na-abịanụ gawa.

Naanị mmadụ ise buterela ya bụ ọrịa na mba ahụ, ebe otu onye nwụrụla maka ya.

Onyeisiala Mnangagwa kwuru na ndị mba ahụ ga-anọ n'ụlọ ruo izu ụka atọ belụsọ ịpụta gote nri na ọgwụ.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

N'ofesi,

Donald Trump

Ebe foto si, Reuters

N'ofesi, onyeisiala Trump e tinyela aka n'akwụkwọ maka iwepụta ego ruru Tari dọla abụọ iji wee nyere ezinụlọ, azụmahịa nakwa ndị ọrụ mba ahụ aka n'oge a coronavirus na-akpa mkpa mkpa.

Nke a bụ ego enyemaka kachasịnụ Amerịka weputarala.

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Aha onyonyo, Etu e si eme 'hand sanitizer'
coronavirus
coronavirus branding