Coronavirus tips: Lee nka asatọ i nwere ike ịmụta iji nweta ego n'ụwa Coronavirụs a

Nwaanyị ji 'laptop arụ ọrụ

Ebe foto si, Getty Images

Gọọmenti steeti ụfọdụ dịka Rivas,Kogi agbachiela ọpụpụ na mbata na steeti ha, ebe ụfọdụ dịka Legos mechiri ahịa.

Enugwu,Anambara Ebonyi,Imo mechiri ụlọakwụkwọ, ma kwụsịkwa ndị ọrụ oyibo ọrụ dịka ọrịa coronavirus jiderela mmadụ 56 na Naijiria.

coronavirus
coronavirus branding

Ụfọdụ ndị mmadụ tụrụ onwe ha mkpọrọ iji gbalahụ ọrịa a maọbụ kesaa ya ndị ọzọ.

Mana ọkụkọ hapụ kwọm, gịnịka ọ ga-eji zụọ ụmụ ya? Onye ọbụla hapụ ịgba mbọ, kedụ ebe opi ga-esi apụtara onye nọ n'ụlọ?

Olileanya dị. I nwere ike ị nọ n'ụlọ gị na-amị ego site na ime ihe doro anya ma sikwa ezi.

Leekwa ihe ndị i nwere ike ime ugbua iji were na-egbu ego mma n'ụwa Coronavirus a chị ọkụ na amụma ugbua:

1. Etu e si eme 'meatpie

'Meatpie'

Ebe foto si, @Foodace

Onye ọnụ ụtọ, ama m na ịta achịcha na-amasị gị nke ọma mana ị ma na ịmụta etu e si eme ya nwere ike ime gị ite ego ugbua ọgbọ ọgụ siri ike?

Ebe ịmụta ime 'meatpie' ji dị mma bụ na i nwere ike ire na ịntanet.

2.Ka e si eme 'hand sanitizer'

Aha onyonyo, Etu e si eme 'hand sanitizer'

Mmanu a na-ete n'aka maka mgbochi ọrịa nke a na-akpọ 'handsanitizer na Bekee bụzịkwa 'American visa' ugbua.

Otu ekpem 'hand sanitizer' a na-erebu N500 na-adazi N1000 kemgbe ikuku coronavirus kubatara Naijiria.

Ọ bụrụ na ịmụta etu e si eme 'hand sanitizer', ọ bụghị naani na ị gaghị na-emefuzi ego, ịzụ ya maka nchekwa gị na-ezianụlọ gị, ị ga-eresi ndị agbataobi gị na ndị ọzọ nọrọ gị nso.

Hand sanitizer

Ebe foto si, Getty Images

3.Etu e si eme ude

Ndị ọkachamara na-eti mkpu maka ọtụtụ kemikal na-emerụ mmadụ ahụ na-adị n'ude ndị ana ere na-ahịa ugbua.

I nwere ike ịmụ ka e si eme ude bekee nke iji aka gị zụrụ ngwa e ji eme ya maọbụ ude akị . Udeakị nwere mkpa ahụike dị iche iche ọ na-egbo n'ụmụaka nakwa ndị okenye.

Aha onyonyo, Lee ihe nzuzo ndị na-eme ude agaghị agwa gị

4.Etu e si eke nnukwu ịchafụ (gele)

I nwere ike isị na anaghị agazị ụka maọbụ agbamakwụkwọ ugbua, mana iwere ugbua ị nọ n'ụlọ mụta etu e si asụ ịchafụ nke ndị Yoroba na-akpọ 'gele', ị mara n' ị naferela.

Ịkwụ n'ihu ugegbe awa kwulu awa tupu ị gaa mmemme ebeela.

Ị ga-ana esikwa na ya enweta nchọnchọ ego, wezuga anya n'ụgwọọnwa gị.

5.Etu e si eme ncha nkọta

Nwaanyí na-esi nri

Ebe foto si, Getty Images

I nwere ike iji oge ezumike mụta etu esi eme ncha nkọta(black soap) e ji asa ahụ.

Ugbua ọtụtụ mmadụ naa-alaghachi na ihe ndị dị ka chi si kee ha'organic products' bụ oge ị ga-eji ya kpaa ego.

6.Etu e si eme abacha mmiri

Ị mụta eti e si abacha mmiri n'oge oke agụụ a na-eche ga-eso 'lockdown', okwu agwụla. Ị ga-anọ n'ofe.

Ịtaghị ya na akị Bekee, ịgwọ ya agwọ maọbụ iresi ndị mmadụ, ụwa ana aga.

7.Etu e si eji ịntanet akpata ego

Nwaanyị ji 'laptop arụ ọrụ

Ebe foto si, Getty Images

I nwere ike ịmụta etu e si na-ede 'blog' banyere ihe ị bụ ọkaibe na ya; etu ire ahịa n' ịntanet, ime websait, mgbasaozi ahịa n'ịntanet

8.Etu esi eme achichia bekee(cake)

Achịcha Bekee

Ebe foto si, @Foodace

9. Mụta asụsụ ọhụrụ

Ugbua a nọ n'agbọ 'Information technology', o nweghị ihe ị nweghị ike ịmụta gụnyere ịmụta asụsụ ọhụrụ.

Ihe o ji kacha mma ugbua bụ na ọ dịghị mkpa na ị ga-agara ya ụlọakwụkwọ.

Naanị chọọ ụzọ ya n'ịntanet.

Ị mụta asụsụ dịka Frenchị, Mandarin wdg ga-abara gị uru n'ihi na i nwere ike ịghọ onye nkuzi asụsụ ahụ ma ji ya akpata ego ma ị mụta ya nke ọma.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: