Lagos Explosion: Etu mberede Abule Ado siri mee na ihe kpatara ya

- Onye dere ya, Chiagozie Nwonwu
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
A nụrụ ụda dị ka nke nnukwu ogbunigwe na mpaghara Abule Ado dị n'okpuru ọchịchi Amuwo Odofin na Legọs stetti ụbọchi ụka bụ Abalị c15 nke Maachị.
Agbanyeghị na ndị mmadụ kwenyere na nnukwu ihe gbara ebe ahụ, dịka ụlọ kụrịsiri ha ụdịrị ihe a na-ahụ na mba Syria na-egosi, ajụjụ ndị mmadu kpụ n'ọnụ bụ, "Ọ gịnị kpatara ihe a?"
Gọọmentị Legọs ehibewere kọmịtị a sị chọpụta nke bụ eziokwu.
Aka na-achị Legọs bụ Babajide Sanwo-Olu ekwela nkwa na ọha ga-amata ihe ha chọpụtara.
Ebe a mberede a mere

Ebe foto si, Google
Ebe ihe metụtara sitere ụzọ Adegbola Olujobi ruo ụzọ Otunba Gani Adams n'Abule Ado.
Ebe a bukari ebe ndị mmadu bi mana ụlọakwụkwọ umụnwaanyị akpọrọ Bethlehem Girls College bụ ihe sepụtere isi karịa n'ebe ahụ.
E nwekara ụlọ ọrụ ndị na-ere gas na-ebe ụzọ Adegbola Olujobi zutere ụzọ Otunba Gani Adams n'Abule Ado.
e nwere nnukwu igwe na-ebu mmanụ agbịdị ebe ahụkwa.
Gini mere?
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Ihe anya hụrụ mberede a na-ekwu na ọ bụ n'ụtụtụ, n'etiti elekere asatọ na itoolu n'ụtụtụ Sọnde.
Ọtụtụ ndi bi na mpaghara ahụ nọ n'ụlọ ụka dịka ụmụakwụkwọ Bethlehem nọ ebe ha na-ekpe mass na ụlọ ụka dị n'ime ụlọakwụkwọ ha.
Otu onye no mgbe ihe mere gwara BBC na ya nọ n'ụzọ ụka oge ọ nụrụ nnukwu isi gas.
Ọ sị, "Asị m ka m ga gwa Fada mana ka m ka na-eru ebe ndị nche na-anọ, gas ekpuchiela ebe niile."
Ọ sị na ya gbara ọsọ gawa ebe ụmụ akwukwọ nọ ga nyee aka kpọpụ ha.
"Ya bụ ihe adịghị mfe," bụ ihe o kwuru, tupu ọ gawa n'ihu ikwu na ya bara ọkada gawa ịgwa Fada. Ọ sị na o ruola nke Fada tupu ọ nụ ọda dị ya ka nnukwu ogbunigwe.
Ọ sị, "Ọ bụ ọkụ si ebe otu onye na-ere nri ka gas ahu sere were daa gbooaa!"
Nwokea ekwughi aha ya si na ya kwnyere na ihe mberede kari ịkarị etu o mere ma ya bụrụ gas ahu gbasara karịa ebe o ruru.
Aka na-achị Amuwo Odofin bụ Valentine Buraimoh gwara BBC okwu n'ebe mberede a mere ka o ka mechara.
Ọ sị na ihe a gbara sitere n'igwe bu mmanụ agbịdị.
N'ọnụ okwu ya, ọ sị na ọ bụ ihe ọ kpọrọ "technical issue" kpatara ya.
Gwomgworo tọrọ n'ọwa mmiri
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Onye ọzọ hụrụ ihe mere kwenyekwere n'ihe onye nke bu kwuru mana o gara n'ihu kwuo na ọ bụ gwomgworo tọrọ n'ime ọwa mmiri na ụzọ Adegbola Olujobi gbawara igwe gas ka ọ na-achọ ụzọ ọ ga-esi pụta.
Nkọwa a gbara ihe nkiri dị na soshal midia na-egosi gwomgworo ahu ka o nọ nso ebe gas na-awụfụsị akaebe
Ka mberede a mechara

Ebe foto si, @followlasema
Ka abalị abụo gachara, n'etiti ụlọ kwụrịsiri na ndu ndi mmadu furu okpokoro gwomgworo ahụ kpụsa na afụsi anwụru ọkụ, dika ọkụ na anwụrụ ọkụ na afụkasị n'ime okukoro di nso na ya ka.
Ndị ọrụ gbata gbata na-akọwa na mmadụ iri abụọ nara mụọ ebe iri abụọ n'ise merụrụ ahụ nọ ụlọ ọgwụ anata ọgwụgwọ.
Ngalaba "Lagos State Emergency Management Agency" (LASEMA) na "National Emergency Management Authority" (NEMA) ka nọ ebe ahụ arụ ọrụ ha.

Ebe foto si, @followlasema














