Lagos Explosion: Gọọmenti Legọs ewepụtala ijeri naira abụọ maka ndị ọkụ gassị metụtara n'Abule Ado
Babajide Sanwo-Olu bu aka na-achi steeti Legọs sị na ya ga emepe aka enyemaka a ga-etinye ijeri naira abụọ maka inyere ndị ọdachi dakwasịrị oge igwe gassi gbara ka ogbunigwe na mpagara Abule Ado dị na Legọs.
Ọ si na a ga-enye ha nde naira narị abụọ na iri ise osugbu ije tie ha aka n'obi tupu kọmịtị ehibere amalite ọrụ maka etu a ga-eji kee ya bu ego.
Ọtụtụ mmadụ nwụru n'ọdachị a nke gunyere ụmụaka.

Ebe foto si, @jidesanwoolu
