Explosion in Lagos: Anụtụbeghi m ụdịrị ụda ahụ mbụ

Aha onyonyo, Explosion in Lagos: Anụtụbeghi m ụdịrị ụda ahụ mbụ

Ndị ọkụ ogbụgba gbara mpaghara Abule Ado dị na Legọs metụtara akọwala etu o ji malite nakwa ụzọ o si metụta ha.

Otu nwoke sị na ụdị ụda ọ nụrụ n'ụtụtụ ahụ na ọ nụtụbeghi ya na ndụ ya mbụ. Ọ sị na ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'ọgbaghaara na amaghị ihe ha ga-eme.

Ọ sị na ọtụtụ n'ime ndị a gbacha ọtọ kama na o jisiri ike chịkọta ezinaụlọ ya.

Otu nwoke ọzọ sị na onye sista na onye fada n'otu ụlọakwụkwọ nọ ebe ahụ nwụrụ ka ha na-achọ ịzọpụta ụmụakwụkwọ ha.

Ọ gara n'ihu kwuo na o chere na ọ bụ otu ụgbọala tipa tọrọ atọ butere ọkụ a gbara.

Cheta na ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ogbunigwe butere nke a mana gọọmentị Legọs steeti sị na ha ka na-eme nyocha banyere ya.

Kirie ya n'uju ebe a.