Gịnị na-ebute oke ọkụ ọgbụgba na Tanka?

Ụgbọala ọkụ gbara

Ebe foto si, Chike Oti

Nkọwa foto, Ọtụtụ ụgbọala agbaala ọkụ na Legos maka ụgbọala bụrụ mmanụ ụgbọala

Legọs bụ otu steeti dị na Naịjirịa ebe ọkụ na-agba tanka oge ọbụla.

Ọtụtụ oge ọ bụ tanka bu mmanụ ụgbọala bụ ihe na-akpata ọkụ ọgbụgba a .

Cheta n'ime ọnwa Juun nke afọ a, nnukwu ọkụ gbara n'ebe akpọrọ Otedola na Legọs steeti ebe mmanụ kariri iri na abụọ nwụrụ nakwa ụgbọala kariri iri anọ na ise gbara ọkụ na yabụ ọkụ.

Ọkụ a gbara maka ụgbọala bu mmanụ ụgbọala na-ehi mmanụ n'okporo ụzọ ahụ.

Ọkụ okporoụzọ Otedola

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Oge ọkụ okporoụzọ Otedola mere ọtụtụ mmadụ na ụgbọala na-aga na-ebe ahụ

Nnukwu ọkụ ọzọ gbara na Festac n'ọnwa December n'afọ 2017.

N'ime mberede a, ụgbọala kariri iri abụọ repiara mana onweghị onye nwụrụ na yabụ mberede.

Ihe na-ebute ọkụ ọgbụgba

Ibrahim Balogun bụ onye ọkachamara n'ihe gbasara ụgbọala gwara BBC Igbo ọtụtụ ihe na-ebute ọkụ ọgbụgba n'ụgbọala buru mmanụ ụgbọala.

Ụgbọala buru mmanụ ụgbọala

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Tanka gbochiri ọtụtụ okporoụzọ na Legọs ugbua

O kwuru na ọtụtụ ndị a na-anya ụgbọala a adịghị elekọta ụgbọala ha nke ọma.

Ọ kọwara na ọ oge taya moto gba, ụdi ya na-adọnye ọkụ na mmanụ ụgbọala ebu na gwongworo.

O kwukwara na mmanụ ụgbọala na-eme ka igwe ta nchara.

Balogun kwuru na: "Ihe a mere ka ọtụtụ ihe onyonyo na social media na-egosi ebe ọtụtụ tanka na-ehi mmanụ n'ụzọ."

O kwukwara na ọtụtụ okporo ụzọ na Legọs adịghị mma.

"Ihe a na-eme ka tanka na-ada oge ọbula"

Ọkụ gbara na Legọs

Nnukwu ọkụ gbara ụgbọala di iche iche ruru itoolu n'okporoụzọ Lagos-Badagry expressway n'ụbọchị abụọ n'ime ọnwa Ọktoba.

Ọkụ okporoụzọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọkụ a na-agbawa obi makana ọtutụ mmadụ na-anwụ n'ime ya

N'ime akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuchiri ndị ụweojii na Legos steeti bụ CSP Chike Oti zipụrụ ndị ntaakụkọ, ọ kọwara na ndị hụrụ ihe mere kwuru na mberede a mere n'isi ụtụtụ.

Ndị uweojii na-ekwu kwa na onweghị ọnyeọbụla nwụrụ na mberede a makana onweghị ụgbọala buru mmanụ ụgbọala dị nso na-ebe ihe a mere.

Ha kọwakwara na ụbọchị oktoba 1, a hụrụ otu ụgbọala na-ehi mmanụ ụgbọala n'okporo ụzọ a, mana agbara mbọ hụ na ha kwụsị yabụ ohi hi mmanụ.

Oti kwuru na onyeisi ndị ụweojii nke Legọs enyeela mkpebi ka ngalaba na-enyocha ihe kpara mberede ọbụla na steeti ahụ chọpụtara ihe kpara ọkụ a.

Akụkọ ga-amasị gị