Etu ị ga-esi ji N5000 debanye aha ụlọahịa gị n'akwụkwọ

Osote onyeisiala

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Gọọmentị kwuru na ha na-agba mbọ ị hụ na ndị na-azụ ahịa nwetere ezigbo enyemaka
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ndị ọrụaka na ndị mgbere e nwela ohere ọhụrụ iji debanye aha n'akwụkwọ n'ọkara ego eji emebu ya site n'ọnwa October 1 ruo December 31, 2018.

Osibanjo belatara ego a n'ọgbakọ mmụta nke iri na itoolu ndị akaọrụ na ndị mgbere mere n'ụbọchị October 2 n'Enugwu.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Osibanjo kwuru na nke a bụ iji kwado mkwa gọọmentị kwere maka ị mee ka ọnọdụ eji eme azụmahia na Naịjịrịa dị fecha fecha.

O kwuru na ndị na-atụ mgbere ahịa bụkarị ndị na-eme ka akụ na ụba Naịjirịa gbagote elu ya mere onyeisiala jị gba mbọ ị hụ na nwetere ihe ọ bụla ga-enyere ha aka n'ịzụ ahịa ọfụma ma nweta nnukwu uru.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Osote onyeisiala

Ebe foto si, Inpho

Nkọwa foto, Ndị na-atụ mgbere ga-eji obere ego debanye aha n'akwụkwọ ụgbua ruo ọnwa December 31 nke afọ 2018

O kwuru na ihe mere eji wepụta ya bụ ohere bụ na gọọmentị ha chọpụtara na ụfọdụ na-azụ ahịa na-abịa ya bụ ọgbakọ adịghị enwe ohere ị debanye aha ụlọ ahịa a n'akwụkwọ maka ọnụ ego dị oke ọnụ.

Ahia

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị na-azụ ahia na Naịjirịa na-ekwu karị na ha a naghị enweta ezigbo enyemaka n'aka gọọmentị

Osibanjo kwuru na ọ bụ ihe ndị ọ bụ ọrụ ha ị debanye aha n'akwụkwọ na-eme kwa mgbe mgbe n'ọgbakọ ahụ ịji hụ na ha weturu ọnụ ego eji eme ya.

Akụkọ ndị ga-amasị: