Lagos governorship Primaries: Ambode ekwetala na e meriri ya

Babajide Sanwo-Olu
Nkọwa foto, Sanwo-Olu ga-azọ ọchịchị n'okpuru APC na ntuliaka 2019

Nke na-eme ugbua Gọvanọ na-achị Lagos steeti bụ Akinwunmi Ambode ejirila ugwu nara mmeri emeriri ya na ntụlịaka imeụlọ APC mere na Lagọs ụbọchị October 2.

O ziri ozi gwa ndị Legọs ha jisike kwado out APC n'udo na ntuliaka na-abịa.

Kọmiti na-ahu maka ntuliaka imeụlọ nke APC na Legọs ekwuola na Babajide Sanwo-Olu bụ onye meriri ntuliaka imeụlọ nke APC na steeti ahụ.

Onye kwuru ihe a bụ Clement Ebri, onyeisi kọmiti a.

Ụnyaahụ, ka ndị na-akwado Babajide Sanwo-Olu na-aṅụrị maka mmeri ha che na o merịri na ntuliaka imeụlọ nke APC mere na Legọs, ndị pati ahụ hibere maka nhazi ntuliaka ahụ kwuru na ihe niile emere ụbọchị ahụ gara werewere.

Mana, ka a na-eloda okpoko a n'akpịrị, onyeisioche pati ahu bụ Adams Oshiomhole gwara ndị ntaakụkọ na ntuliaka Legọs gara nke ọma, ma kwukwa na ihe niile dị n'aka ndị nhazị ntuliaka a Bekee kpọrọ Nationala Working Commitee (NWC) nke Clement Ebri no n'isi oche ha.

Ka chi na-eji, onye bụ onyeisioche APC na Legọs bụ Tunde Balogun, kwuru na ntuliaka emere na Legọs bụ Babajide Sanwo-Olu meriri.

Cheta n'elekere asatọ n'ụtụtụ Oktoba 2, ọtụtụ ndị mmadụ pụtara na wọdụ dị iche iche ebe a na-eme ntuliaka a.

Ambode na Sanya-Olu

Ebe foto si, AMBODE/APC

Nkọwa foto, Ambode na Sanya-Olu bụ ndị na-azọ ọkwa n'APC Legọs

Ndị ntaakụkọ BBC nọ na-ebe ahụ kwukwara na a hụrụ ebe ndị mmadụ na-ebinye aka n'akwụkwọ na ntuliaka imeụlọ a.

Bola Tinubu bụ nna uku otu APC pụtakwara maka ntuliaka a, mana ndị kọmiti a na-ekwu na ihe a niile anaala n'iyi.

Onyeisi kọmiti a akpọrọ Clement Ebri kwuru na, n'ime ọgbakọ ha nwere, ha kpebiri na o were ihe ha ga-agbanwe tupu ha bido ntuliaka a.

Ndị mmadụ na-ekwu na ihe a were ike i bụ ihe mere gọvanọ Akinwunmi Ambode apụtaghị maka ntuliaka nke mere na Oktoba 2.

Ambode apụtaghị

Gọvanọ Legọs steeti bụ Akinwunmu Ambode abịaghị ebe ha na-eme ntuliaka imeụlọ nke APC na Legọs steeti.

Oge o jiri nkeji atọ nwere gafere otu elekere nke ehihe (1:30pm) bụ oge a na-akwụsị ntuliaka imeụlọ APC na-steeti ahụ, o nweghị onye hụrụ Ambode na Wọdụ A5 na A6 ebe a na-atụ anya ya.

Akinwunmi Ambode na Babajide Sanwo-Olu bụ ndị na-ọzọ ọkwa oche gọvanọ na Legọs bụ steeti dị ukwu na Naịjirịa.

Kemgbe 1999, gọvanọ niile na-eji afọ asatọ achị Legọs mana ugbua were ike ime ya nke mbu, otu gọvanọ ga-eji sọọsọ afọ anọ were chịa Legọs steeti.

Ndị otu APC na Legọs
Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị otu APC pụtara maka ntuliaka imeụlọ mere na Legọs

Ọnọdụ pụtara maka akụkọ na-ekwu na Ambode na nna ukwu otu ndọrọndọrọ ahu bụ Asiwaji Bola Tinubu anaghị ahụ anya na anya.

Ambode ka na-ekwu na onweghị eziokwu dị n'ime akukọ a.

Mana ka o si dị ugbua, ndị omeiwu 36 n'ime 40 dị na steeti ahụ na-akwado Sanya-Olu.

Onweghị onye maa ihe ga-eme Ambode ugbua.