Coronavirus tips: 'Anambra bidoro kemgbe ọnwa Jenụwarị kwadobe maka Coronavirus' - nnochite anya kọmịshọna

Willi Obiano

Ebe foto si, facebook.com/james.eze

Simeon Onyemaechi nọchitere anya Kọmịshọna na-ahụ maka ahụike n'Anambra steeti gwara BBC Igbo etu steeti ya si kwadote maka ọrịa Coronavirus.

1. Sayensị na-eme mgbanwe

Iji maa atụ o kwuru na n'izuụka ole na ole gara, a dọrọ ndị mmadụ aka na ntị maka ikpu "Facemask"

Mana ugbua ihe atụgharịala a na-asịzi ndị mmadụ jiri ya kpuchie ihu ha mana ekputenaghị ya aka.

Ugbua ekwuola na mmadụ niile nwereike ịkpu.

coronavirus
coronavirus branding

2. O nweghi ihe jikọrọ 5G na ọrịa Coronavirus

Ọ bụ teknụzụ ọhụrụ nwereike ịbu radiation nke ga-eme ka ahụike mmadụ kụọ akụ nke ga-eme ka mmadụ nwụọ site n'ọrịa.

ọ bụghị na ọ bụ ya na-ebute ọrịa Coronavirus na nke ahụ bụ nghọtahie.

Simeon Onyemaechi

Ebe foto si, Simeon Onyemaechi

Nkọwa foto, Dọkịnta Simeon Onyemaechi

3.Etu Anambra si kwadote ugbua

Lee ihe ndị Dọkịta Onyemaechi kwuru maka nkwado Anambra steeti:

Ebe ọgwụgwọ ICU nwere akwa na ventilator isii

Ebe ọgwụgwọ ọzọ nwere akwa narị abụọ na ọma iri anọ na Mbaukwu.

Anambra agaghị eche ka ọrịa Coronavirus bata tupu ha kwadobe.

Ịkụziri ndị na-azụ ahịa maka ịkwọ aka na idebe akụkụ ha ọcha nakwa ịkuziri ndị na-agba ụgbọala njem maka ndị mmadụ ịnye ibe ha efe nke Bekee kpọrọ "social distancing".

Onyemaechi kwuru na atụmatụ ndị a gosiri na ihe ka Anambra steeti mkpa bụ igbochi ọrịa a karịa ịgwọ ya agwọ.

4.Anambara a ga-enwe ụlọ nyocha nke ya?

N'ịza ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ gbasara Anambra ịnwe ebe nyocha nke ya n'ime steeti, Kọmịshọna ahụ kwukwara na Gọvano Willie Obiano na-agba mbọ ịhụ na nke a mezuru.

O kwuru na onyeisi NCDC kọwara na e nwere usoro esi enweta ebe nyocha na ọ bụghị gọọmentị steeti ahụ ka ọ dị n'aka.

O kwukwara na n'agbanyeghị nke a, steeti Anambra ebidola usoro ahụ nke ga-eme na n'oge adịghị anya ọ ga-abịa n'Anambra steeti.

Dịka ọ dị ugbua, Kọmịshọna ahụ kọwara na nyocha niile a na-eme bụ na Irrua dị n'Edo steeti ka a na-eme ya.

5.Coronavirus abụghị ọrịa ndị ọgaranya

Na ngwụcha mkparịtaụka, Dkt Onyemaechi kwuru na ndị mmadụ echekwana na ọrịa a bụ ọrịa ndị ọgaranya.

O kwukwara na mgbochi ọrịa ka ọgwụgwọ ya ma jirikwa ohere ahụ na-adọ aka na ntị ka ndị mmadụ kwọ aka ha, nye ibe ohere ma nọrọkwa n'ụlọ iji hụ na ọrịa ndị a efesaghi.

O kwuru na ihe ga-enyere ndị mmadụ aka bụ ịnwulite ahụike ha dịrị nkwadobe ma na-arị ọ chukwu ka ọrịa ahụ ghara ịbata n'Anambra steeti.