Coronavirus Lock down: Ndakpọ akụnaụba, oke agụụ na ihe ndị ọzọ so 'Lock Down' na Naịjirịa

Ụmụ Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist Igbo

Ndị gọvanọ steeti niile na Naịjirịa enweela nkwekọrịta imechi njem i si na steeti baa na steeti ruo izuụka abụọ iji belata mfesasị coronavirus.

Ọ bụ ihe doro anya na ụdịrị mkpebi a nwere otu ihe maọbụ abụọ ọ na-eme na ndụ nakwa akụnaụba ndị obodo.

Aha onyonyo, Lock down in Nigeria: Lekwa ka ndị Enugu si nabata ihe ndị China nyere ha

Ya mere akụkọ a bụ ka anyị tụlee etu mkpebi ha ga-eji metụta ndụ nakwa akụnaụba ndị Naịjirịa.

Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe akụnaụba ndị obodo bụ Chidi Lemchi.

Ọ sị na otu uru ọ hụrụ gbara ọkpụrụkpụ na mkpebi ndị gọvanọ a bụ na onwereike ibelata mfesasị ọrịa coronavirus dịka ha si kwuo.

Mana ọghọm ndị ga-eso nke a buru ibu ọkachasị maọbụrụ na gọvanọ emeghi ihe ndị ha kwesịrị ime tupu ha na-amachi njem a.

Lemchi sị na ụfọdụ ọghọm dị na mmechi njem steeti na steeti a gụnyere;

Akụnaụba ndị zoro ezo ga-adakpọ:

Eke Obigbo
Nkọwa foto, Eke Obigbo dị na Rivas steeti tọgbọrọ chakoo ka ndị mmadụ kwere nọrọ n'ụlọ

Lemchi sị dịka Naịjirịa dị ugbua na ọ bụ akụnaụba ndị zoro ezo si n'aka ndị ọrụ aka di iche iche, ndị azụmaahịa bụ ihe ụmụafọ Naịjirịa ji biri.

Mana site na mmechi obodo a, ahịa agaghị azụ, ndị ọrụ aka agaghị arụ ọrụ. Nke a ga-eme ka akụnaụba a dakpọọ bụ nke emetụta akụnaụba ndị a na-ahụ anya.

Agụụ ga-arị ibe ya elu:

Onye ahụ adịghị

Ebe foto si, Getty Images

Lemchi sị na agụrụ ga-adị n'obodo karịa ka o si dị ugbua maka na ọtụtụ ndị "a rụọ e rie" agaghịzi na-arụ nke ha ga-eji na-eri.

Ohi na Mpụ:

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na ndị mmadụ ahụghị nri ha ga-eri n'ihi mmechi obodo, na ihe ọzọ ga-abụzi ịchọwa ebe ha ga-ezute ego maọbụ nri ha ga-eri. Nke bụ na ị ga-anọ n'ụlọ mmadụ a bịa kụọrọ gị aka maọbụ bịa buru ite nri na ihe ndị ọzọ.

Ọgbaghara ga-adị:

Ọ sị na ugbua e mechiri ụfọdụ steeti na e nwetula akụkọ ọgbaghara n'ụfọdụ ebe, ka ụfọdụzie mgbe e mechiri steeti niile na Naịjirịa, na oke ọgbaghara nwereike ịdapụta n'ọtụtụ ebe di iche iche.

Lemchi gara n'ihu kwụpụta ihe o chere ndị gọvanọ a kwesịrị ime n'ụdị ọnọdụ a.

Ọ sị ka ha nye ohere ka ndị aka ọrụ a ji akụnaụba ndị zoro ezo na-arụ ọrụ ha kama na a ga na-ele ha ahụ kwa ụbọchị maka njirimara coronavirus tupu onye ahụ ebido ọrụ.

Ọ kwuru na ha ga-agba mbọ hụ na enyemaka ọbụla ha ga-enye ga-eru ndị o kwesirị iru aka nakwa n'oke buru ibụ na-abụghị nke otu iko osikapa ụfọdụ na-eketa.

N'ikpeazụ ọ sị na atụmatụ ndị gọvanọ dị mma kama ha kwesịrị imezi ụfọdụ ihe tupu ha a na-agbaso ya.

Akara ntụ-ntụ
coronavirus
coronavirus branding
Akara ntụ-ntụ