Imo state: Ihedioha agbaghala nyocha gọọmentị Imo steeti chọrọ ime ya

Emeka Ihedioha

Ebe foto si, Emeka Ihedioha/Twitter

Onye bụbu Gọvanọ Imo steeti bụ Emeka Ihedioha agbaghaala nyocha gọọmentị steeti ahụ chọrọ ịme ya n'ụlọikpe.

Akwụkwọ ya kọwara na ọ bụghị Gọvanọ ka iwu dere ga-eme ụdịrị nyocha ahụ ma kwukwa na dịka iwu si kwuo.

O kwukwara na e kwesiri ịnye gọọmentị mpụtara mmefu ego steeti ahu kwa afọ bụ Annual Audit report na Bekee tupu ha e mee nyocha ọbụla.

Cheta na Hope Uzodimma na-achị Imo steeti kwuru na ihe ruru nde iri na isii furu efu n'akpaego steeti ahụ.

Rivas steeti ekutula ume ndụ

Governor Wike

Ebe foto si, RVGH press

Aka na-achị Rivas steeti bụ Nyesom Wike ekwuola na a ga-amalite ịmepetu steeti ahụ inye ndị mmadụ ohere igo nri na ọgwụ.

Ohere ngagharị ga-amalite n'ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Mee ma kwụsị n'abalị ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Mee.

Gịnị na-eme n'egwuregwu na mba Briten?

Boris Johnson

Ebe foto si, AFP

Gọọmentị mba Briten ekwuola na o nweghi egwuregwu ọbụla a ga-eme n'ala ha rue opekatampe ụbọchị mbụ nke ọnwa Juun.

Nke a na-abịa dịka ndị isi egwuregwu bọọlụ na-enwe nzụkọ ịma etu ha ga-esi malite egwuregwu ọzọ n'ihu ọrịa Coronavirus.

Mmadụ 20 anwụọla n'otu obodo a wakporo dị n'akụkụ Naịjirịa

Gọvanọ na-achị obodo Tillaberi na mba Niger aha ya bụ Tidjani Ibrahim Katiella ekwuola na ndị ọra ọbara bu ọgbatumtum batara obodo bia kpaa mkpa mkpa a.

Otu ọjọ a na-amabeghị ndị ha bụ tikasịrị ụlọ ahịa ndị mmadụ, zuru ewu na ọkụkọ ma were ike gwa ndị obodo ahụ ka ha gbalaga.

Kamgbe afọ 2017 ka e tinyere ọnọdụ gbata gbata n'obodo Tillaberi ya na mba Mali, Burkina Faso na Benin nwere oke.

Obodo niile edepụtara ebe a na ndị omekome Jihadist na-akwata ya kamgbe.

Ndị nọ mgbe ịhe a mere na-ekwu na o mere n'elekere anọ nke mgbede dịka ndị ahụ bu egbe na-ede obodo dịka Gadabo na Koira Teguio.

Nyerenu gọọmentị aka chọta ihe na-egbu mmadụ na Yobe - Lawan

Sinetọ Ahmed Lawan

Ebe foto si, @SenAhmadLawanI

Nkọwa foto, Ahmed Lawan

Ahmed Lawan bụ onyeisi ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa etiela ndị Yobe steeti aka n'obi maka ọnwụ gburu ọtụtụ mmadụ na steeti ahụ.

Ọ dụkwara ndị obodo ọnwụ a na-akpa ike na ya ka ha nyere gọọmentị aka na mbọ ha na-agba ịchọpụta ihe na-egbu ndị mmadụ ka aja ebe ahụ.

Na Saụt Afrịka

Ndị uweojii Saụt Afrịka

Ebe foto si, Getty Images

Ndị na-ama aka ọchịchị na mba Saụt Afrịka na-aba mba maka etu e si machie ire mmanya na anwụrụ a na-ese ese dịka ha nọ na mmechi obodo.

John Steenkamp bụ onyeisi Democratic Alliance kwuru na mmachi a na-anapụ gọọmentị ọtụtụ ego ha kwesịrị irite n'ụtụisi ma na-etinye ya n'akpa ndị na-ezo ezo ere ya.

Saudi Arebia etinyekwuola VAT

Nwoke na-agụ ego ndị mba Saudi bụ Riyal

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwoke na-agụ ego ndị mba Saudi bụ Riyal

Mba Saudi Arabia ekwuola na ha ga-ebuli ụgwọ VAT ha site na pasentị ise ruo pasentị iri na ise site n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Julaị.

N'otu aka ahụ, ha kwukwara na bido n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Juun, na ha ga-akwụsị inye ha ego nkwado obibi ndụ ha malitere inye ha kemgbe afọ 2018.

Man Utd azụla Ighalo - Neville

Gary Neville

Gary Neville gbaburu Manchester United bọọlụ adọọla Ole Gunna Solskjaer bụ onye nchịkọta otu ahụ aka na ntị ka ọ ghara ịzụ Odion Ighalo.

Neville kwuru na o cheghi na Ighalo tozuru ka a kwụọ nde paụnd iri abụọ n'isi ya, ọkachasị maka etu ihe dị ugbua.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: