Bob Marley: Ihe o ji bụrụ eze 'Raggae'

Bob Marley

Ebe foto si, BBC/Graham Wiltshire

    • Onye dere ya, Chris Sanctus Okereke
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist

Bob Marley bụ odogwu nwoke ji egwu na nka gbanwee omenala nakwa echiche na nkwenye ndị mmadụ n'ụwa gbaa gburu gburu.

Kemgbe ọ nwụrụ n'ụbọchị iri na otu ọnwa mee afọ 1981, ude, ebube na ọrụ ọma ya malitere ịgbasa karịa ka ọ dị mgbe ọ dị ndụ.

Ihe buliri ya elụ otu a bụ ọrụ ọma ya n'iti egwu nke o ji ekwupụta mmegbu, mkpagbu na uru ọ bara mmadụ ileghere ahụhụ ụwa anya, nwewe aṅụrị bụ nke ọ ọkụrụ na egwu mgbe ọ sị, "forget your troubles and dance" .

Ọ gbasakwara ozi ihunanya nke ukwu bụ nke o gosiri na egwu ya bụ "One Love".

Ị ji mata nke a, mgbe ọ nwụrụ ka e ji nye ya nturuugo "Rock and Roll Hall of fame" n'afọ 1994.

Na 1999 ka Times Magazine ji nye egwu ya nke ọ kụrụ n'afọ 1977 a kpọrọ "Exodus" nturuugo ọbaegwu bụ ọkaibe na narị afọ, ya bụ "Album of the Century award".

N'otu aka ahụ ka ha ji nye egwu nke ọ kpọrọ "One Love' "Song of the Millenium".

Bob Marley

Ebe foto si, Getty Images

Kemgbe o wepụtara albọm ahụ ọ kpọrọ "Legend" n'afọ 1984, ya bụ egwu na-ere ihe karịrị narị pụkụ abụọ na iri ise (250,000) kwa afọ, nke tinyere ya n'ọkwa iri na asaa egwu merela etu ahụ kamgbe ndị 'Sound Scan' malitara ịgụkọ egwu mere nke ọma n'afo 1991.

N'afọ 2001 ka e nyere ya nke kacha nke bụ "Grammy Liftime Achievement Award" bụ echichi a na-echi naanị ndị bụ ochiedike n'egwu.

Ihe ndị niile mere Eze Ndu, onye malitere na nwata kpọwa egwu Bob Marley ji sị na "ọnwụ ya bụ nwaamadị dịka ọnwụ Jesus Christ maka na ndị mmadụ chọpụtara uru ọ baara n'ọnwụ ya".

Eze sịkwa na "Bob Marley bụ mmụọ, bụrụkwa mmadụ".

Bob Marley

Ọ kọwara na ya bụ nwaamadị ji ahụhụ nne ya tara dịka onye isiojii were mara ahụhụ ndị ọzọ na-ata n'obodo ya bụ Jamaica wee si otu ahụ gbawara mmadụ niile ọgọ site n'egwu ya pụrụiche a kpọrọ Reggae.

Eze sị na "mụ na onwe m na-ahụ Bob Marley ka mụọozi bịara n'ụdị mmadụ izi ozi maka ọdịmma mba Afrịka".

Ọ sị na "mgbe Bob Marley dị ndụ, ndị be anyị amaghị na ọ bụ onye amụma. Ọ bụ mgbe ọ nwụrụ ka a bịara chọpụta n'ezie na ọ bụ onye ammụma".

Eze ndu

Ebe foto si, Eze Ndu

Nkọwa foto, Eze Ndu bidoro na nwata kpọwa egwu Bob Marley

Dịka o si maa atụ, "ncheta a na-echete Bob Marley dịka nchete ndị otu krịast na-echeta ya maka ọ mere ka ọtụtụ n'ime anyị chọpụta ihe anyị amaghị gbasara ndụ anyị na-ebi, gbasara ka e si kee anyị n'ụwa a na mmegide a na-emegide anyị nakwa nkata dị iche iche bụ nkata ọjọọ ndị ọcha kpara megide ndị isi ojii".

Eze sị na Bob Marley mere ka ndị isi ojii mara ka anyị bụ ndị isiojii ga-esi jikọ onwe anyị ọnụ.

O wutere Eze na onwebeghị ebe ọbụla n'ala igbo eji aha Bob Marley gụọ okporoụzọ dịka e si eji aha ndị ọzọ.

Bob Marley

Ebe foto si, Getty Images

Ọ rịọrọ ndị isi ọchịchị, ọkachasị n'ala Igbo ka ha kawa ahụ nwere aha ya gụọ okporoụzọ dị mkpa maka ncheta ya bụ odogwu nwoke.

Bob Marley chọpụtara na-ọnwere ọrịa Kansa na mkpuru ukwu ya na 1977.

Ya na ya bụ ọrịa gbagidere mgba ruo 1981 bụ mgbe ọ nwụrụ na ụlọọgwụ dị na Miami n'ọnwa Mee afọ ahụ.

A mụrụ ya n'ụbọchị isii ọnwa febụwari 1945.

Bob Marley
Nkọwa foto, Bob Marlye ji egwu ya kpezie ndí isi ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ bụ Michael Manley na Edward Seager na-ese okwu mgbe ahụ na Jamaica

Marley mụrụ ụmụ iri na abụọ nke gụnyere ụmụ nwoke asaa na ụmụnwaanyị ise.

Damian bụ nke mbụ, Ziggy sowe ya. Nke ikpeazụ bụrụ Robert.

Nke a bụ afọ iri atọ na itoolu Bob nwụrụ.

Akụkọ ga-amasị gị