Etu agha na coronavirus si anyụ Cameroon ịkpakwụ

Ndị agha nke Motorized Infantry Brigade nke 21 na-agagharị n'ụzọ Buea, dị na mpaghara Saụt-westị mba Kameru n'ụbọchị 26 nke ọnwa Epreelụ 2018

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Ngala Killian Chimtom
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News, Yaoundé

Beatrice Titanji bụ onye ikike dịrị onye na-amasị ama ama, ji ọṅụ malie elu mgbe otu n'ime otu ndị anaghị ata ntị ha ata kwenyere iwetu egbe ha n'ụbọchị 29 nke ọnwa Maachị.

Ha meburu nke a iji nye ndị si na mpaghara ndị na-asụ Bekee ohere ichekwa ndụ ha n'aka coronvirus na-anyụ ụwa ịkpakwụ, mana ọṅụ ya adịla ka akịilu n'ọnụ ya dịka ọgụ na mgba ahụ malitere ọzọ.

"Ọnọdụ a na-atụ ezigbo ụjọ. Puku kwuru puku mmadụ tọrọ n'ime ọhịa", ka Dkt Titanji gwara BBC.

"Kedụ etu anyị ga-esi gwa ha maka Covid-19?" Ka o jụrụ.

Otu Southern Cameroons Defence Forces (SCDF) ji aka ha kwekọrịta ịtụsa egbe, ka onyeisi ngalaba United Nations bụ António Guterres rịọrọ ka mkpagbu na esemokwu niile na-aga na mbaụwa kwụsị.

"Iwe nje a ji bịa egosila na agha a abaghị uru," ka o kwuru dịka ọ sịkwa "O ruola oge anyị ga-atụsa ngwaagha ma nyụkọọ mamịrị ọnụ ịzọ ndụ anyị."

Aha onyonyo, Tupu ịpụọ n'ezi, gbaa mbọ jide ihe anọ ndị a

Mana, enweghi otu ndị na-achọ nnwereonwe ọzọ (ha ruru 15) kwere ege ntị n'arịrịọ a.

Otu n'ime otu ndị a a na-akpọ Ambazonia Governing Council, so na ndị nke kachasị ukwu, kwuru sị na ikwekọrịta na ha ga-atụsa ngwaagha ha ga-enye gọọmentị ohere izibata ndị agha ha n'ebe ndị ha zọtarala dịka ebe ha nwere ikike ọchịchị.

Agụụ na nrịanrịa

Gọọmentị mba Kamerun bụ nke Onyeisiala Paul Biya si na mpaghara na-asụ asụsụ French nọ n'isi ya, ekwebeghi atụsa ngwagha ha ma nọrọkwa n'elu ya machie ụgbọelu ndị chọrọ ịgbatara ndị mmadụ ọsọ enyemaka nakwa ndị nke ndị mmadụ ji eme njem nkịtị, dịka ha sị na ha na-achọ igbochi mfesa ọrịa a.

"Ọ bụrụ na anyị enweghị ụzọ anyị ga-esi wegara ndị mmadụ nri na ọgwụ, ọtụtụ n'ime ha ga-atagbu onwe ha n'ahụhụ. Agụụ na ọrịa ga-egbu ha," ka Dkt Titanji bụ onye na-edu otu a kpọrọ Women's Guild for Empowerment and Development, so etinye ọnụ n'ihe gbasara ikpe udo na mba Kamerun.

Map: Cameroon
Presentational white space

Ma Bekee ma Frenchị bụ asụsụ njirimara mba Kamerun kemgbe ha ji nweta nnwereonwe ha n'aka ndị ọcha, mana ndị nke si na mpaghara na-asụ Frenchị na-achị ka eze, nke mere ka ndị nke na-asụ Bekee na-atamu maka ịkpa oke.

Ihe karịrị mmadụ 3,000 anwụọla kemgbe a malite igosi iwe maka etu esi ejikarị asụsụ Frenchị ekwu okwu n'ụlọikpe nakwa n'ụlọakwụkwọ dị na mpaghara ndị Bekee dị na Nọt-West na Saụt-West bụ nke ọgbaghara chịkọtara ọnụ n'afọ 2017.

Ọgbaghara a achụpụla ịhe ruru nde mmadụ - chụba ụfọdụ n'ime ha n'ime ọhịa ebe ha rụrụ ụlọ aja ma bụrụkwa obodo nke ha dịka ha bidokwara ụwa n'isi ka ebe ha si bịa bịazịrị bụrụ ihu agha.

Presentational grey line

Kamerun - ka kewara n'ụzọ ndị ha si n'aka ha nweta nnwereonwe:

Eserese na-egosi ka Otto von Bismarck, bụ onyeisiala Jamini oge ahụ ji mma n'elu achịcha Bekee a wara awa ma dee ya "Afrịka".

Ebe foto si, Alamy

Nkọwa foto, Ndị ji Afrịka n'agbụ mgbe ochie "kewarisiri" okeala Afrịka
  • Jamini malitere ịchị ha ọchịchị aka ike n'afọ 1884
  • Ndị agha Briten na mba Fransị achụpụ Jamini n'afọ 1916
  • E kewara Kamerun ka afọ atọ gachara - Fransị ketara pasentị 80% ebe Briten ketara pasentị 20
  • Mpaghara Kamerun bụ nke ndị Fransị na-achị nwetara nnwereonwe n'afọ 1960
  • Ka e mechara referandum, ndị nke Briten na-achị bụ Saụt Kamerun esonye Kamerun, ebe ndị nke Nọt Kamerun sonyere Naịjiria na-asụ Bekee
Presentational grey line

Ngalaba UN na-ahụ maka ụmụaka bụ Unicef na-ekwu na ọ bụ nanị 255 maọbụ pasentị 34 n'ime ụlọọgwụ 7,421 dị na mpaghara Nọt- West na Saụt West na-arụtụ ọrụ ma ụfọdụ anaghị arụ chaacha maka agha a.

ụfọdụ ụlọọgwụ ndị a bụ ndị awakpooro ma gbaa ọkụ nke mere ka ndị na-arụ ebe ahụ gbaa ọsọ.

Nke a ebutela ụjọ ihe ga-eme ma ọrịa Covid-19 ruo ebe ndịa ahụ.

Presentational white space

Dịka ọ dị ugbu a, ihe karịrị mmadụ 2,200 ebutela ọrịa a na Kamerun ebe ihe dịka mmadụ otu narị anwụọla kamgbe ọnwa Maachị, nke mere ka ha bụrụ ndị ọrịa kacha gbuo na mpaghara central Afrịka.

Nwoke nọ n'ụlọ oriri ebe gbara ọkụ maka esem okwu a. na mba Kamerun.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nsogbu a emebiela ọtụtụ ọrụ na ihe ndị mmadụ

Enwebeghị ihe gosiri na ndị nnụpụ isi na-alụ ọgụ nwere nchekwa maka coronavirus maọbụ nwee ụlọọgwụ a na-agwọ coronavirus.

Dịka ndị gọọmentị mba Kamerun na-alụsọ ndị nnupu isi a ọgụ, Titanji kwuru sị " Anyị achọghị agha n'oge di otu a n'ihi na ọ mere ka ịnyere ndị mmadụ aka sie ike ọkachasị ugbua coronavirus na-egbu ndị mmadụ"