Nigeria Killings: Nlaghachị Buhari ọ ga-akwụsị oke ogbugbu na Naịjiria?

Ebe foto si, Twitter/APC Nigeria
Ndụ mmadụ adịghị abụọ ya mere okaiwu Goddy Uwazuruike ji kwuo na obi ya na-agwa ya na onyeisiala Buhari nwereike ịkwụsị oke ogbugbu na-eme n'ụfọdụ ebe na Naịjiria.
Uwazuruike kwuru na onyeisiala chọrọ ime dịka onyeisiala ọ bụ na ọ ga-akwụsịnwụ oke ogbugbu ndị a.
Ọ na-arịọ ka onyeisiala kwụba aka ya ọtọ ma mee ka ụwa mara ihe o na-eme gbasara oke ogbugbu na-eme n'akụkụ dị iche iche ugbua na Naịjirịa.
Ifeanyi Olumba bụkwa oye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị kwuru na onyeisiala ọ bụla batara ọchịchị kwesiri i bu nchekwa n'obi dịka mkpa ọ ga-ebu ụzọ gbro ndị ọ na-achị.
Olumba kwuru na onyeisiala ọ bụla na-emelighị nke a adaala nakwa nke a ga-eme ka ndị oji ego achụ ego gbalaga.
Anyị gbara mbọ ịnụta n'ọnụ ndị lọọrụ onyeisiala mana onye dịka Femi Adesina bụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi ya ebughị ekwenti ya.
Akụkọ ka na-abịa.




