Stella Damasus ekwuola etu o si malite ịza Damasus

Ebe foto si, Stelladamasus/Insta
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Omee ihe onyonyo nke bụ Stella Damasus akụwaala akụoyibo nsugbe na mkaprịtaụka ya na BBC Igbo nwere.
Mgbe a jụrụ ya ihe mere aha nna ya ji bụrụ 'Damasus', ọ kọwara na ọ bụ n'oge agha Biafra ka nna nna ya gbanwere aha ya iji gbalahụ ọnwụ n'aka ndị agha Naịjirịa.
"Aha nna nna m bụ Ojukwu mana ndị agha Naịjirịa nụrụ ya ha echee na ọ bụ ezinaụlọ Odimegwu Ojukwu ka anyị si, ya mere o jiri gbanwee ya", ka ọ kọwara.
Lee ihe ndị ọzọ ọ gbara ama maka onwe ya ebe a.
- Nna ya bụ onye Asaba ebe nne ya bụrụ onye Owere
- A mụrụ ya n'Edo steeti ebe nne na nna ya na-arụ ọrụ n'ụlọakụ
- Aha Igbo ya bụ Obiageli
- Ọ gụrụ akwụkwọ n'Edo steeti
- Ọ mụrụ ụmụnwaanyị abụọ





