Stella Damasus ekwuola etu o si malite ịza Damasus

Stella Damasus

Ebe foto si, Stelladamasus/Insta

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Omee ihe onyonyo nke bụ Stella Damasus akụwaala akụoyibo nsugbe na mkaprịtaụka ya na BBC Igbo nwere. 

Mgbe a jụrụ ya ihe mere aha nna ya ji bụrụ 'Damasus', ọ kọwara na ọ bụ n'oge agha Biafra ka nna nna ya gbanwere aha ya iji gbalahụ ọnwụ n'aka ndị agha Naịjirịa.

"Aha nna nna m bụ Ojukwu mana ndị agha Naịjirịa nụrụ ya ha echee na ọ bụ ezinaụlọ Odimegwu Ojukwu ka anyị si, ya mere o jiri gbanwee ya", ka ọ kọwara.

Lee ihe ndị ọzọ ọ gbara ama maka onwe ya ebe a.

  • Nna ya bụ onye Asaba ebe nne ya bụrụ onye Owere
  • A mụrụ ya n'Edo steeti ebe nne na nna ya na-arụ ọrụ n'ụlọakụ
  • Aha Igbo ya bụ Obiageli
  • Ọ gụrụ akwụkwọ n'Edo steeti
  • Ọ mụrụ ụmụnwaanyị abụọ

Lee ihe ndị ọzọ o kwuru n'uju ebe a