Abia State: Ụkọ bread emeela anyị ịwa n'Aba

Dịka achịcha Bekee 'bread' kọrọ ụkọ n'Abia steeti abalị olemole gara aga, ụfọdụ ndị bi na steeti ahụ akọọla etu ha na ihe si eme.
Ndị ụlọọrụ na-emepụta bureedi arụbeghị ọrụ ụbọchị olemole nke mere na ndị mmadụ ahụghị nke ha ga-azụ.
Chima Akudike, onye bi n'Aba gwara BBC Igbo na ya bụ ihe adịghịrị ọtụtụ ndị mmadụ mfe.
O kwuru sị: "Ọtụtụ ndị mmadụ bụ bureedi na mmanya ọtọ bịrịbịrị ka ha ji eme nri ụtụtụ."
"Tulegodi ihe ndị dị otu a ga-emezi ugbu a."

Ebe foto si, Getty Images
Dịka Akudike si kwuo, ụlọahịa niile dị n'okirikiri ebeo bi enwebeghị bureedi ruo n'ụtụtụ ụbọchị Tuzde.
Ọ kọwara na ọ bụ abụbụ ọrụ ka ụlọọrụ na-emepụta bureedi gbara n'ihi na ha kwuru na ọnụahịa ntụ e ji eme achịchị nke bekee kpọrọ 'flour' arịala elu nke ukwu.
Mana onye ọzọ bi n'Aba gwara BBC Igbo na ndị bureedi amalitela ire obere obere n'okirikiri nke ya.
Gịnị kpatara bureedi jị kọ n'Abịa

Ebe foto si, Getty Images
Otu jikọtara ndị na-eme bụredị n'Abịa steeti bụ otu a kpọrọ 'Master Bakers' na Bekee.
Onyeisi ha bụ Emma Nwaohia gwara ndị ntaakụkọ na ha chọrọ ịme nzacha ma mkpocha iji kwadoo ịmalite ọrụ n'uju kemgbe akpọghechara obodo ọzọ maka ọrịa coronavirus.
Nwaohia kwuru na ọ bụ ya kpatara ha ji wụsaa ọwa kemgbe otu izuụka gara aga.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ndị otu 'Master Bakers' ga-eji ohere ahụ tịnye anya n'ihe ụfọdụ na-akpa ha.
Nwaohia kwuru na agha coronavirus a mekpara ha ahụ nke ukwuu nke mere ọnụahịa ihe niile ha ji eme bụredị ji rịchaa elu ọjị.
O kwuru na kemgbe Maachi, na ihe niile e ji eme bụredị dịka flọọ, shụga, bụta na ndị ọzọ arịala elu ugboro ise karịa.
BBC Igbo na-agba mbọ inweta Nwaohia ka ọ kọwaara anyị ihe na-emenụ n'uju.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:









