World Indigenous Day: Ihe mere Awka, Enugu,Umuahịa na obodo ndị ọzọ ji bụrụ isi obodo

E nwere ọtụtụ obodo dị n'ala Igbo ma ha niile nwere akụkọ etu ha siri bido.
Kama ihe ị kwesiri ịma maka etu obodo siri bido bụ na ọ dị ụzo abụọ.
Otu bụ nke ndị ụlọakwụkwọ na ọkammụta ndị na-ahụ maka ihe mere mgbe gboo nke bekee na-akpọ history ha nyoputere.
Nke abụọ bụ akụkọ ndị obodo na-akọ bụ etu ha siri bido nke enwereike ịkpọ 'oral history.'
Ọ dị mkpa ka onye ọbụla chọrọ ịma etu obodo siri bido mara na-enweghị ebe edere ya ede nke mere na nghọtaghe na adịkarị.
Ọ bụ ọkammụta abụọ ọnụ na-eru n'okwu maka ihe gbasara akụkọ ihe mere ndị Igbo bụ Ọkammụta Chigozie Nnabuihe na Ọkammụta Akex Ugwuja tinyere ọnụ n'akụkọ a.
Akụkọ mere etu Asaba siri bido

Ebe foto si, Delta State Government/ Facebook
Nnabuihe kọwara na ndị Igbo emeela njem oge gboo gaa ebe a na-akpọ mpaghara Savana nke mechara bụrụ Sahara ma siri ya gaa mba Ijipt.
Ọ kọwara na ndị Igbo nọkwa n'ebe bụ Benin ugbu a tupu ndị Benin a bịa chụpụ ha.
Dịka akwụkwọ mazị Dennis Osadebey dere nke ọ kpọrọ "Building a Nation", ọ kọrọ akụkọ ihe mere maka otu nwoke aha ya bụ Nnebisi.
Nnebisi bụ nwa nwaanyị Nteje aha ya bụ Diaba onye lụrụ onye Igala aha ya bụ Ojobo.
Ọ bụ mgbe a ndị obodo jụru ịnye Nnebisi oke ya na ọ bụghị onye Nteje.
Nke a mere ka Nnebisi na ndị na-eso ya si Nteje pụọ were chọwa ala nke ha.
Osadebey na-akọwa na njem Nnebisi dịka o duru ya site na Nsugbe ruo ebe mmiri Ọma Mbala na nke Niger zutere onwe ha.
Ọ kọwara na Nnebisi na ndị otu ya gafere mmiri a were rute Ikpele Mmili (Cable Point).
Ha kwụsịri ebe a were sị ka ha kọọ ubi n'ihi n'oge ọrụ ubi ka bidoro.
Ihe ha kọrọ mere nke ọma nke mere ka ha birizie ebe ahụ.
Nnebisi kpọrọ ebe a Ahaba.
Kama Osadebey kọwara na ọ bụ onye Ukọchukwu si mba Itali aha ya bụ Carlo Zappa ma bụrụ kwa onye na-ese maapụ bụ onye dere aha obodo Ahaba dịka Asaba were zịgara ndị ọchịchị.
Ihe mere eji mee Asaba isi Obodo
Asaba bụ ebe ọzọ eji ịzụ ahịa mara mgbe gboo.
A na-ere ihe dịka Akpụ, Ji, Mmanụ na Ọji n'Asaba.
Nke a mere ka ọ bụrụ isi ụloọrụ National African Company site n'afọ 1886 ruo afọ 1900.
Asaba bụ kwa isi ụloọrụ ndị Royal Niger Company.
Ọ bụ n'afọ 1991 ka e mere Asaba isi obodo Delta steeti. (Britannica)
Akụkọ kọrọ etu Ụmụahịa siri bido

BBC Igbo jụrụ Mazi Timothy Nnochirionye Ohaka, onye bụ onye Umuahịa etu ya bụ aha siri gbanwee.
Ohaka kwuru sị " Ọ bụ mgbe ndị ọcha sị Obodo Bende abata ime Ibeku, ha rutere na-ebe a na-azụ ahịa were jụọ ndị mmadụ aha ebe ha nọ, a sara ha "Ọma Ahịa".
Kama dịka o siri ha ike ikpọpụta ha kpọọ ya "Ụmụahịa".
Mazị Ohaka kọwara na-enwere nnukwu ahịa na-azụ karị nke mere eji akpọ ya Ọma Ahịa.
Ọ kọwakwara na Ọma Ahịa a dị n'Ibeku ,ma sịkwa na obodo ndị mezuru umuahia ugbua gụnyere Olokoro,Ubakala, Ọhụhụ na Ibeku.
Ọkammụta Akex Amaechi Ugwuja kọwara na-enweghị obodo bidoro dịka ụmụahịa kama ọ bụ ndị ọcha chịkọtara obodo ndị a ha kpọọ ya Ụmụahia.
Ọ kọwara na mgbe arụrụ ụzọ ụgbọ oloko nke si Pọtakọtụ gawa Enugwu bidoro azụmahịa n'ọdọ ụgbọ oloko n'ụmụahịa na ebe a na-akpo Ibeku Junction.
Ugwuja kwuru na ihe akpọburu ebe ahụ bụ ama ahịa maka ahịa nọ ebe ahụ.
O kwuru sị "ọtụtụ ndị obodo dịka Ibeku na ụmụọkpara ga-ekwu na ha furu efu site n'ala, kama anyị ma na mmadụ niile nwere ebe ha siri bịa".
Ugwuja gara n'ihu kwuo na dịka ndị ọkammụta na-ekwu na ndị obodo mejupụtara ụmụahịa dịka ụmụọkpara na Ibeku nwereike site na mbaghara Cross River na Qua Igbo River.
Ọ kọwara sị "obodo ndị a nke ndị ọkammụta na-akpo BEnde Culture nwereike ị bụ ndị sitere na mpaghara Cross River na mpaghara etiti Igbo were bịa".
Ihe mere eji mee Ụmụahịa isi Obodo
Ụmụahịa bụ ebe dị mkpa maka azụmahịa oge ochie.
Ugwuja kọwara na ihe kpatara ya bụ ọ bụ ọdọ ebe ụgbọ oloko si Enugwu a ga Port Harcourt na-akwụsị.
Nke ana-enye ndị ahịa oghere ire ahịa ha ma tinye kwa ya n'ọgbọ oloko.
Ụmụahịa bụ kwa isi obodo mgbe a na-alụ agha Biafra site n'ọnwa Seputemba afọ 1967 ruo ọnwa Disemba afọ 1969.
Akụkọ kọrọ etu Enugwu siri bido
Gọọmentị Enugwu steeti na-akọwa na ndị mmadụ ebirila n'Enugwu kamgbe 6,000BC.
Ha kọwara na ọ bụ ndị na-ahụ maka ụkpụrụ obodo gwuputara ihe gosiri nke a n'afọ 1978. (Enugu State Govt.)
Ọkammụta Alex Amaechi Ugwuja kọwakwara na dịka ụmụahịa, na Enugwu bụ obodo dị iche iche mejupụtara ya.
Kama anyị ga-etinye anya n'obodo Nike bụ ndị ala ha mwjupụtara ọtụtu ebe a na-akpo Enugwu taa.
Obodo Nike
Akwụkwọ Ngozika. A Obi-Ani dere nke ọ kpọrọ "Intergroup Relations in Igboland: A study of Precolinial to 1908 Opi and Nike Communities" kọwara ihe ọ chọpụtara na nyocha maka obodo Nike.
Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ọ dere gụnyere :
Ọ bu obodo na mpaghara di iche iche bịakọrọ were bụrụ obodo Nike
Ọ bụ Obodo iri abụọ na anọ mejupụtara obodo Nike.
Ha gụnyere Ibagwa Nike, Amakpo, Onyoho, Ama Owele, Eziama, Edem, Amorji, Nokpa, Alulu, Iji Nike, Ogui Nike, Nneke Uno, Nneke Odenigbo, Ugwogwo Nike, Ogbeke, Agbogazi, Ako, Emene, Akpuoga, Ugwuomu, Nchetenche, Onu-Ogba, Nkwubor na Obinagụ.
Aha obodo Nike sitere na "Ndị Ike" dịka ndi agbataobi ha ha meriri n'agha na-akpọ ha.
Ọ kọwara na mgbe gboo, Nwoke ọbụla amụrụ n'ụbọchi ahịa Eke na-abụ onye agha.
Ndị Nike bụ ndị eji azụm ahịa mara, ihe ha na-agba mgbere ya bụ ohu, nnu na ihe ndị ọzọ.
Ha na ndị Nsukka na ndị Opi na-azụkọ ahịa nke ọma.
Ihe mere eji mee ya isi Obodo
A chọpụtara coal na otu Obodo mejupụtara Enugwu bụ Enugwu Ngwo n'afọ 1909 nke mere ka anya ndị ọcha nọrọ na ya bụ obodo.
Enugwu bụ isi ọchịchị nke mpaghara ọwụwa anyanwụ site na'fọ 1939 ruo 1951 ma bụru kwa isi obodo nke mpaghara ọwụwa anyanwụ site n'afọ 1951 ruo afọ 1967.
Enugwu bụkwaisi obodo mgbe agha Biafra site n'ọnwa Mei ruo ọktoba nke afọ 1967.
Enugwu bụ kwa isi obodo Anambra steetri site n'afọ 1976 ruo afọ 1991.
Ọ bụ n'afọ 1991 ka ekewapụtara Enugwu steeti nke isi obodo ya bụ Enugwu. ( Britannica)
Akụkọ kọrọ etu Abakeleke siri bido

Ebe foto si, BBC igbo
Enweghị onye ma ebe ha siri bịa kama e chere na ọ bụ ndị Izii bụ ndị bu ụzo bịa.
Ndị ọzọ kwa zitere Ezza,Ikwo,Ọnịcha na Ngbo bịara biri na Abakeleke. (Ebonyi state Gov.)
Abakeleke bụ ihe akpọrọ ebe a mgbe ndị ọcha bịara.
Ọ bụ ndị Izii kacha nwee ala na ebe a kpọrọ Abakeleke.
Ugwuja kwuru na ha nwereike ịbụ ndị sitere na mpaghara Cross River, Benue na etiti Igbo mejupụtara ndị Izii.
Ọ kwuru sị "Abakeleke n'oge 1950 bụ isi obodo mpaghara Ogoja province n'ọwụwa anyanwụ".
Kama Ugwuja kwuru na ya emebegfhị nyocha nke ọma maka ndị obodo Abakeleke.
Ihe mere eji mee Abakeleke isi Obodo
Abakeleke oge gboo bụ obodo eji nri na-ịzụ ahịa nri were mara.
Ala Abakeleke dị mma maka ọrụ ugbo.
Ọ bụ n'afọ 1996 ka ekewapụtara Ebonyi steeti were mee Abakeleke isi obodo ya.(Ebonyi state Gov.)
Akụkọ kọrọ etu obodo Ọka siri bido

Ugwuja kọwara na ọ bụ Obodo iri atọ na atọ mejupụtara Ọka.
E nwere mpaghara abụo dị n'Oka nke bụ Ifite Ọka na Ezi Ọka.
O kwuru si "Akụkọ na-ekwu na njem mbiri kacha dị mkpa bụ ndị sitere ugwuọba nke dị n'Enugwu steeti taa".
O kwuru na e nwekwara uọdụ ndi si Igala were bịa biri n'Ọka.
Akụkọ etu Ọka siri bido bụ akụkọ maka ndị di iche iche sitere ebe dịkwa iche iche were biri n'Ọka.
Ugwuja kwuru sị " Ihe ndị mere ka ha nọkoọ ọnụ dịka obodo bụ akaọrụ ịkpụ ụzụ, ọgwụ ọdịnala na ọrụ aka".
Ọ kọwara na n'oge na adịghị anya, na ndị a niile bidoro hụwa onwe ha dịka ndị Ọka.
O kwuru na ndi mmadụ dịka Okammụta Onwụkanjọ na-akọwa na ọrụ ikpụ ụzu sitere Enugwu steeti bata Ọka.
Ihe mere eji mee Ọka isi Obodo
Eji ịkpụ ụzu were mara ndi ọka.
Nke mere ka ọ bụrụ ebe ama ama n'ala Igbo.
Ndị Ọka na-akọ ugbo nke ọma na-akọpụta ihe dịka Ji, Akpụ, Ọka na mmanụ nri.
Ihe ọzọ mekwara Ọka ji bụru obodo ama ama bụ arụsị ha bụ Agballa nke a na-ahụta dịka Chukwu nke Arọchukwu.
E mere ọka isi Obodo Anmabra steeti n'afọ 1991.(Britannica)


















