Igbo History: Lee aha ndị ochie kpọrọ obodo ha mgbe gboo tupu akpọgharịa ha

Ndị ọrụ

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chigozie Ohaka
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo service

Aha obodo bụ njirimara obodo pụrụiche nke ndị obodo ji amacha ma ha zute ndị obodo ọzọ.

E nwere ọtụtụ usoro obodo ji enwete aha ha, ma nwekwa ihe na-akpata ka obodo gbanwee aha.

Mgbanwe aha na-esikwa ụzọ dị iche iche abịa, nke kpatara na-abịa n'ala Igbo, e nwere ụfọdụ obodo aha ha adabachaghị dịka ezigbo aha Igbo si ada.

Nke a mere ka BBC Igbo zọpụ njem ka ha mara etu mmiri si banye n'opi ụgbọrọ.

BBC Igbo gara mahadum nke Legọs ebe anyị na ọkammụta n'ihe gbasara asụsụ Igbo bụ Chigozie Nnabuihe gbụwara anyị ya bụ akị oyibo nsugbe maka aha ụfọdụ obodo n'ala Igbo.

Mazi Chigozie Nnabuihe kwuru na ọ bụ nsupe asụsụ Igbo ka mgbanwe aha ndị a kacha metụte.

Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ sị na mkparịta ụka banyere mgbanwe aha obodo:

Aha obodo ugbua: Ụmụahịa - Abia steeti

Aha obodo mgbe ochie: Ọma Ahịa

Aha obodo ugbua: Owerri - Imo Steeti

Aha obodo mgbe ochie: Owe Ere

Aha obodo ugbua: Orlụ - Imo steeti

Aha obodo mgbe ochie: Ọlụ

Aha obodo ugbua: Awkuzu - Anambra Steeti

Aha obodo mgbe ochie: Ọkụ Ụzụ

Etu aha siri bịa: Mkpọru ya n'isi bụ Ọkụ Ụzụ achagbunam, ya pụtara na e jiri ịkpụ ụzụ mara ndị bi n'ala. Aha ha bụ ek

Aha obodo ugbua: Okigwe dị n'Imo steeti

Aha obodo mgbe ochie: Ọka Igwe

Aha obodo ugbua: Enugu

Aha obodo mgbe ochie: Enu Ugwu

Etu aha siri bịa: Ọ bụ obodo ndị nọ n'elu ugwu

Aha obodo ugbua: Okpaala Ngwa

Aha obodo mgbe ochie: Okpu ala Ngwa

Aha obodo ugbua: Okpaala - Imo steeti

Aha obodo mgbe ochie: Ọkpụ ala

Etu aha siri bịa: Ọkpụ nke a pụtara ala dị ọkpọtọrọọkpụ (Ancient Land)

Aha obodo ugbua: Anambra

Nke a bụ Awka Flyover, Anambra steeti
Nkọwa foto, Ihe a bụ otu n'ime fly over dị n'Awka, Anambra steeti

Aha obodo mgbe ochie: Ọma Mbala

Etu aha siri bịa: Nke a sitere n'aha mmiri

Aha obodo ugbua: Port Harcourt dị na Rivers Steeti

Aha obodo mgbe ochie: Igwe Ọcha

Aha obodo ugbua: Opobo - Rivers steeti

Aha obodo mgbe ochie: Igwe Nga

Aha obodo ugbua: Bonny - Rivers Steeti

Aha obodo mgbe ochie: Ịgbanị

Aha obodo ugbua: Oyigbo dị na Rivers steeti

Aha obodo mgbe ochie: Obi Igbo

Abakiliki, Ebonyi steeti

Ebe foto si, BBC igbo

Aha obodo ugbua: Abakiliki - Ebonyi steeti

Aha obodo mgbe ochie: Abakeleke

Aha obodo ugbua: Mbaise - Imo steeti

Aha obodo mgbe ochie: Agbaaja, Ahiara, Ekwerazụ, Oke Ovoro na Ezinihite

Etu aha siri bịa: Ọ bụ obodo ise nọrọ onwe ha ka ndị ọcha tịkọro ọnụ kpọọ ha mbaise. Ruo taata, ndị Mbaise nwere omenala dị icheiche ha kwenyere na ya.

Aha obodo ugbua: Asaba - Delta steeti

Aha obodo mgbe ochie: Ahaba

Etu aha siri bịa: Ndị Ahaba bụ ndị si obodo nteje n'Anamabra steeti

Akwa osimiri Naịja

Aha obodo ugbua: Onitsha

Aha obodo mgbe ochie: Ọnịcha

Aha obodo ugbua: Ibusa - dị na Delta Steeti

Aha obodo mgbe ochie: Igbo Ụzọ

Etu aha siri bịa: Ndị Ibusa sị Isu nke dị n'Imo steeti ụgbụ a

Aha obodo ugbua: Ogwashị

Aha obodo mgbe ochie: Ọgwa Ahị

Akụkọ na-eso ya: Ndị Ogwashi sitere ala Nri ga-biri ebe ha bi ụgbụ a

Nnabuihe kọwara na ọtụtụ aha ndị nwere "Ọ" na nsupe ha na ndị ọcha tinyere ya "AW".

Obodo ndị a gunyere Awka - Ọka, Awkunanaw - Ọkụnanọ, Amawbia- Amaọbịa, Awkuzu-Ọkụ ụzụ na Awgu - Ọgwụ.

Nke a bụ maka na nsupe a mere ya ka ọ dịrị ndị ọcha mfe ịkpọpụta.

Ugbụ a, ka anyị were ụfọdụ Obodo ndị a kọwara gị etu aha ha siri gbanwee.

ma Ahịa - Umuahia

Umuahia
Nkọwa foto, Tawa n'Umuahia

BBC Igbo jụrụ Mazi Timothy Nnochirionye Ohaka, onye bụ onye Umuahịa etu ya bụ aha siri gbanwee.

Ohaka kwuru sị " Ọ bụ mgbe ndị ọcha sị Obodo Bende abata ime Ibeku, ha rutere na-ebe a na-azụ ahịa were jụọ ndị mmadụ aha ebe ha nọ, a sara ha "Ọma Ahịa".

Kama dịka o siri ha ike ikpọpụta ha kpọọ ya "Ụmụahịa".

Mazị Ohaka kọwara na-enwere nnukwu ahịa na-azụ karị nke mere eji akpọ ya Ọma Ahịa.

Ọ kọwakwara na Ọma Ahịa a dị n'Ibeku ,ma sịkwa na obodo ndị mezuru umuahia ugbua gụnyere Olokoro,Ubakala, Ọhụhụ na Ibeku.

Anị Ahaba - Asaba

Dịka akwụkwọ mazị Dennis Osadebey dere nke ọ kpọrọ "Building a Nation" kọrọ akụkọ ihe mere maka otu nwoke aha ya bụ Nnebisi.

Nnebisi bụ nwa nwaanyị Nteje aha ya bụ Diaba onye lụrụ onye Igala aha ya bụ Ojobo.

Ọ bụ mgbe a chọrọ ịke ala ka otu onye kparịrị nnebisi were gwa ya na ọ gaghị eketa ala n'ihi na ọ bụghị onye Nteje.

Nke a mere ka Nnebisi na ndị na-eso ya siri Nteje pụo were chọwa ala nke ha.

Oadebey na-akọwa na njem NNebisi dịka o duru ya site na nsugbe ruo ebe mmiri Ọma Mbala na nke Niger zutere onwe ha.

Ọ kọwara na Nnebisi na ndị otu ya gafere mmiri a were rute Ikpele Mmili (Cable Point).

Aha onyonyo, Jane Ada: Nwaada Igbo ji ịkpụ ụzụ na-egosi ụwa arụsị e jiri mara ndị Igbo

Ha kwụsịri ebe a were sị ka ha kọọ ubi n'ihi n'oge ọrụ ubi ka bidoro.

Ihe ha kọrọ mere nke ọma nke mere ka ha birizie ebe ahụ.

Nnebisi kpọrọ ebe a Ahaba.

Kama Osadebey kọwara na ọ bụ onye Ukọchukwu si mba Itali aha ya bụ Carlo Zappa ma bụrụ kwa onye na-ese maapụ bụ onye dere aha obodo Ahaba dịka Asaba were zịgara ndị ọchịchị.

Igboụzọ - Ibusa

Obodo a dị na Delta steeti. Asụsụ Igbo ha bụ nke a na-akpọ igbo Enuanị.

Aha onyonyo, Lee ihe ndị puruiche BBC hụrụ n'ala Igbuzo

Otu nwaafọ obodo a bụ Patrick Adigwe kọwara BBCIgbo etụ aha obodo ha sị site nha Igbọụzọ gbanwee bụrụ Ibusa.

Adigwe kọwara na-enwere akụkọ abụo na-akowa etu aha ha sị malite.

Akụko na-akọwa na enwere mmadụ abụọ ndị sị mba ọzọ were bịa n'ala ahụ..

Aha onyonyo, Awgu Caves: Ọgba ndị a chere ndụ ndị Mmaku n'oge gboo

Dịka Dan Olisa Dieyoi sịkwara dee n'akwụkwọ ya, ọ bụ Edini onye sị Nrị bụ ụzọ bịa ala Igbuzo dịka o soro nwanne ya nwoke bụ Ogboli nna ha chụpụrụ ya n'ihi na ọ dịnara otu nwunye nna ya.

Onye nke abụọ bụ Umejei bụ nwa Eze ndị Isu ndị obodo chụpụrụ dịka ogburu mmadụ na mgba nke ala Isu n'asọ nsọ.

Edini kwụsịrị na Ani-oshe nke dị na Igbụzọ ebe Umejei kwụsịrị na Ani-Nshi Ogboli.

Ọ bụ obodo abụọ a bidoro Igbụzọ.

Adigwe sị na "nnanna anyi kwuru na-enwere nghọtaghe maka aha Igbụzọ, ebe ụfọdụ sị na ọ bụ "Igbo nọ n'ụzọ" ebe ụfọdụ si na ọ bụ "Igbo bu ụzọ".

Kama otu ihe pụtara ihe bụ na aha ha bụ "Igboụzọ".

Dịka o siiri ndị ọcha ike ịkpọpụta "Igbụzọ" ha denyere ya dịka "Ibụsa" n'akwụkwọ ha na-edenye aha obodo.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị